N'Anambra, Ndị Nta Akụkọ Abụọ Amụọla Ejima Ka Ha Nọchara Ahọ 13 Amụghị Nwa

Sep 23, 2021 - 20:43
 0
N'Anambra, Ndị Nta Akụkọ Abụọ Amụọla Ejima Ka Ha Nọchara Ahọ 13 Amụghị Nwa

.

Izunna Okafor dere akụkọ a


Oke ọñụ dara na nsonso a dịka ndinanwunye bụkwá ndị nta akụkọ abụọ na steeti Anambra mụrụ ejima abụọ ma gakwa ụka ikupụte nwa, ka ọ gachara ahọ iri na atọ ha jiri lụọ ma biri dịka dinanwunye n'amụghị nwa.

Ndị nta akụkọ abụọa, bụ Maazị Chris Obileri nke ụlọ mgbasaozi 'Purity FM' Awka, na Oriakụ Ngozi Obileri nke mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service' ka e kwuru na ha malitere ịlụ dinanwunye n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba ahọ 2007; mana kemgbe ahụ, ha na-achọ ma na-elekwàsị Chukwu anya maka mkpụrụ nke afọ.

Kaosiladị, ka ọ gàchàzịrị ahọ iri na atọ ha jiri chọba nwa, Chineke jiri ụmụejima abụọ wee gọzie dinanwunye a. Ọ bụkwa nwoke na nwaanyị ka ha mụrụ, nke na-egosi na ọñụ ha ezuola òkè.

N'okwuchukwu ya n'ụka ikupute nwa ahụ, nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St Joseph's Catholic Church, Awka', Ụkọchukwu Kelvin Okeke kelere Chineke maka ọrụ ebube Ya na ngọzị Ya n'isi ụmụmmadụ; ọbụladị dịka) kpọkuru ma dụọ ndị òtù Christ ọdụ ka ha na-agbaso nzọụkwụ Ya.

O nyere Chineke ekele maka ihe ịrịba ama ahụ O mere na ndụ Maazị Obileri na nwunye ya, ma gwakwazie onye ọbụla ka ọ tụkwasị obi na Chineke n'ihi na o nweghị ihe ọbụla nyịrị Ya omume, ọbụladị ma n'oge ọ dị ka a ga-asị na olileanya adịghịzị.

O jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ka were Chineke mere ebe ndabere na ebe mgbaba na ebe e wusiri ike, ma na-ewedàkwa onwe ha ala, n'ihi na Christ wedara onwe Ya ala wee jeere ụmụmmadụ ozi oge Ọ nọ n'ụwa, n'agbanyèghị ogoogo ya.

N'okwu ha n'otu n'otu, Maazị na Oriakụ Obileri kwupụtara ahụmahụ ha ogologo oge ahụ ha nọ n'amụghị nwa, ma kwuo na ha tụkwasịrị okwukwe ha niile na Chineke ma were obi ha niile na-ekpere Chukwu, wee ruo mgbe Ọ zara ha ekpere ma jiri nye ha ụmụejima abụọ otu ugboro.

Ọ kpọkuru dinanwunye na ezinụlọ dị icheiche na-agabiga ụdị ihe nsogbu dị etu ahụ taa ka ha tinye okwukwe ha na ntụkwàsịobi ha na Chineke, n'ihi na ọ pụrụ ime ihe ịrịbaama oge olileanya adịghịzị.

Ha kelekwàzịrị ndị nta akụkọ na ndị ọzọ dị icheiche bịara sonyere ma nọnyere ha na mmemme ọñụ ahụ, ma kpekwazie ka ihe ọñụ gaa n'ihu ime n'ezinụlọ ha dị icheiche, ma rịọkwa Chineke ka ọ gaa n'ihu ịza ndị ọzọ n'ọkwa n'ụdị nsogbu ahụ ekpere na ihicha ha anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484