N'Anambra, Mmadụ Iri Na Atọ Emerụọla Ahụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Jan 27, 2021 - 21:34
 0
N'Anambra, Mmadụ Iri Na Atọ Emerụọla Ahụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor

Mmadụ iri na atọ gbanahịrị ọnwụ mberede ma nweta nnukwu ihe mmerụahụ n'ogoogo dị iche iche n'ihe mberede abụọ dapụtara na mpaghara ebe dị iche iche n'ime steeti Anambra.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ nsonso a site n'aka onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps', FRSC (ngalaba steeti Anambra), bụ SRC Florence Edor.

O mere ka a mara na n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarịa a, na mmadụ iri na otu nwètara ihe mmerụahụ n'ihe mberede dapụtara n'ebe a maara dịka Coca-Cola, na mpaghara 'Upper Iweka' dị n'Ọnịshà (Ọnịtsha).

Ọ kọwara na ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara n'etiti ụgbọala atọ ('Toyota Harrier Jeep' nwéré akàrà efere AAA 935 FN; 'Atrai Wagon Bus' nwéré akàrà efere BLF 02 XB; na 'Atrai Wagon Bus' ọzọ nwéré akàrà efere HKW 07 XZ), ma bụrụkwa nke metụtara mmadụ iri na asaa (ụmụnwoke iteghete, ụmụnwaanyị asaa, na otu nwatakịrị).

Onye ọnọmgbeomere kọwara na ọ bụ ịgba oke ọsọ na esighị n'usoro kwesiri ekwesi wee kwụsị ụgbọala kpàtàrà ihe mberede ọkporoụzọ ahụ jiri dapụta, ma mee ka a mara na ọ bụ otu onye obi ọma buuru mmadụ iri na otu (ụmụnwoke asatọ na ụmụnwaanyị atọ) ahụ nwetara mmerụahụ wee gaa ụlọọgwụ tupu ndị ọrụ FRSC rute n'ebe ahụ.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, mmadụ abụọ ọzọ nwetakwara mmerụahụ n'ogoogo dị iche iche oge otu ụgbọala nwèèrè onwe ya ihe mberede okporoụzọ na mpaghara Uli, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala dị na steeti Anambra. 

Onye ọnọmgbeomere mèrè ka a mara na ya bụ ihe mberede dapụtara oge ụkwụ ụgbọala 'Mitsubishi L300 Bus' nke 'It Is By His Grace Mass Transit' (nwere akàrà efere KPP 191 YT) gbara, dịka ya bụ ụgbọala nọ n'ụzọ ijè, nke mezịrị na onye na-anyà ụgbọala ahụ enweghịzị ike ijidetenwu ya; o wee ghaa èdèri ma makpuo n'akụkụ ọhịa.

Akụkọ kọrọ na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtàrà mmadụ iri na anọ (ụmụnwoke iri na ụmụnwaanyị anọ) ebe ụmụnwoke abụọ n'ime ha nwétara nnukwu ihe mmerụahụ; ndị ọrụ FRSC wee buru ha ozigbo gaa n'ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes Hospital' dị n'Ihiala maka inye ha ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere ihe mberede ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Andrew Kumapayi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka na-akpachapụrụ ụgbọala ha anya nke ọma tupuu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ. 

Dịka ọ na-akpọku ha ka ha gbaa mbọ hụ na ha na-agbanye ọkụ trafigetọ ha oge ọbụla ha chọrọ ịrọ ụzọ maọbụ ịkwụsị n'otu akụkụ; Maazị Kumapayi dụkwara ha ọdụ ka ha na-ego táyà ọhụrụ ma kwụsị igo nke Tokunbo maọbụ táyà nwụrụ anwụ, n'ihi na ọ bụ ihe dị etu ahụ na-eme ụkwụ ụgbọala ji agba n'ụzọ ma mee ka ihe mberede okporo ụzọ dapụta.

O kpekwazịrị ka ndị dị iche iche nwetara ihe mmerụahụ gbakere n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.