N'Anambra, APC Etòóla Buharị, Gwa Ndị Anambra Debànye Aha n'Òtù Ahụ

Feb 18, 2021 - 21:58
Feb 18, 2021 - 22:18
 0
N'Anambra, APC Etòóla Buharị, Gwa Ndị Anambra Debànye Aha n'Òtù Ahụ
Maazị Basil Ejidike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya, mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

N'ịgbaso nke a, òtù ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' (APC), ngalaba nke steeti Anambra akpọkuola ụmụafọ steeti ahụ ka ha sonyere òtù ndọrọndọrọ ahụ ma sonyesiekwa ike na ndebànyegharị aha ahụ na-aga n'ihu ugbua na steeti ahụ.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisioche òtù ahụ n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Basil Ejidike, n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ndebànyegharị aha ahụ ya bụ nke òtù ahụ malitèrè ime na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria na nsonso bụ nke magburu onwe ya ma bàkwa úrù n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, tinyekwuoro na ọ ga-enyekwara òtù ahụ aka ịmata ọnụọgụgụ mmadụ ole bụ ndị òtù ahụ n'ezie ma matakwa ndị ha bụ.

O mere ka a mara na isi ọchịchị òtù ndọrọndọrọ ahụ n'Anambra na-agbasi mbọ ike ịhụ na ya bụ atụmatụ ndebànyegharị ahà gàrà nke ọma n'ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nke e mere n'ụzọ ghe anya oghe, n'enweghị nsogbu ọbụla.

Dịka ọ na-akọwa na Gọvanọ Dave Umahi nke steeti Ebonyi na Gọvanọ Hope Uzodimma nke steeti Imo nyèrè ha nde naịra iri anọ (N40m) maka iji kwàdo atụmatụ ndebànye aha ahụ, Maazị Ejidike kwuru na ha chọkwùrù ego ruru narị nde naịra abụọ (N200, 000) iji mee ka ya bụ atụmatụ gaa siriri-werere na steeti ahụ.

N'ime nde naịra iri anọ ahụ Gọvanọ abụọ ahụ nyere ha, ọ gara n'ihu kwuo na ha kesààrà mpaghara wọọdụ 326 dị na steeti ahụ N50, 000 n'ótù n'ótù, ma kesàárá okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ N100, 000 n'ótù n'ótù, iji wèé kwàdó ha, tinyekwara ego nke ha nyegasịrị òtù kọmitii dị iche iche so n'ọrụ idebànyè aha ahụ. 

O kwuru na ha na ndị e ji okwu ha agba ìzù n'òtù ahụ ga-eme nzukọ ma tụọ árò banyere etu ha ga-esi nwetakwuo ego ahụ, iji wee mee ka ya bụ atụmatụ ndebànye ahà gaa nke ọma na steeti ahụ, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na ya bụ ndebanye aha.

O kwupụtara olileanya o nwere na APC ga-enweta mmeri na nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme na steeti Anambra n'ime ahọ a, ma kpọkuo Ndị Anambra ka ha sonyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ ugbua site na ndebànye aha ahụ na-aga n'ihu, n'ihi na ọ bụ ohere ọma dịịrị ha iji banye n'òtù ndọrọndọrọ ahụ, bụ òtú ndọrọndọrọ ji ọkwa ọchịchị n'ala Nigeria ugbua.

N'ihi na Igbo sị na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo; Maazị Ejidike jikwàzịrị òhèrè ahụ wee kelee onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari maka ọrụ mmepe dị iche iche ọ rụgoro na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria kemgbe o siri bànye n'ọkwa ọchịchị, ya na ọrụ ndị nke ọ ka ji n'aka ugbua na mpaghara ahụ, bụ nke o kwuru na o nwebeghị onyeisiala maọbụ otu ndọrọndọrọ ọbụla rụgoro ụdị ọrụ dị otu ahụ na mpaghara ahụ na mbụ. 

Dịka ọ na-akpọpụtasị ụfọdụ ọrụ mmepe ahụ ọchịchị Onyeisiala Buhari rụrụ na mpaghara ahụ, o kwezịrị ya nkwà na ndị mpaghara ahụ agaghị ada mbà n'inye ya, ọchịchị ya na otu ndọrọndọrọ APC nkwàdo zuru òkè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484