N'Adamawa, Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Atọ Maka Ohi Abalị

Sep 26, 2021 - 20:48
 0
N'Adamawa, Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Atọ Maka Ohi Abalị

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ na steeti Adamawa, bụ ndị a na-enyo ènyo na ha bụ ndị ohi ji abalị aga n'ụlọ n'ụlọ ezu ndị mmadụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Adamawa, bụ DSP Suleiman Nguroje bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na Yola bụ isi obodo steeti ahụ, ụbọchị ụka.

Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ohi ahụ dịka Kalifa Mustapha (gbara ahọ iri abụọ); Tumba Abubakar (gbara ahọ iri abụọ na asaa); na Faisal Abdullahi (gbara ahọ iri abụọ na otu), ma kwuo na ha bì na mpaghara Shagari Phase 1, Phase 2 na Abuja Street dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Yola South', ma bụrụkwa ọkaibe n'izu ohi abalị.

O kwuru na onyeisi ndị uweojii e wetara ọhụrụ na steeti ahụ, bụ CP Mohammed Ahmed Barde zigara ndị ọrụ uweojii nọ na mpaghara Yola, bụkwazị ebe ha nọrọ wee nwụchie mmadụ atọ.

Ọ kọwara na nnyocha e mere na-egosi na mmadụ atọ ahụ sò n'òtù ndị ohi mmadụ asaa zuru ohi dị egwu n'ụlọ ruru iri abụọ na abụọ n'ọnụọgụgụ n'ime ọnwa atọ gara aga, ma zukọsịa ọtụtụ ihe dị icheiche ndị mmadụ.

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kọwàrà na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ agbakọọla ma wepù, dịka o siri metụta etu ọnọdụ mpụ na arụrụala siri gbata kwụrụ na steeti ahụ, ya na ihe e ji ebuso mpụ ba arụrụala agha, ma kwupụtakwa na ọ ga-aga n'ihu ịhụ na steeti nọ n'ezi ọnọdụ nchekwa.

O kwukwara na onyeisi ndị uweojii ahụ enyela ntụziaka ka ndị ọrụ ya na-apụtazị ọrụ n'abalị ọbụla, iji wee chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ ma wepu ha ọnụ n'ara. 

Ọ dị ncheta na ọ bụ n'izuụka gwụrụ agwụ ka CP Mohammed Ahmed Barde ahụ wụchara n'Adamawa dịka onyeisi ndị uweojii steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484