Ka Anyị Tụọ Alò 2021: A Kpọkuola Ndị Igbo Ka Ha Chekwaa Omenala, Njirimara na Ọdịnala Ha

Sep 30, 2021 - 22:59
 0
Ka Anyị Tụọ Alò 2021: A Kpọkuola Ndị Igbo Ka Ha Chekwaa Omenala, Njirimara na Ọdịnala Ha

By Izunna Okafor, Awka

Ụlọ ezumezu nke ọba akwụkwọ steeti Anambra juru kpụmkpụm n'ọnụ n'isi ngwụcha izuụka gara aga, dịka e merubere ótù óké mmemme nkwàlite njirimara na omenala Igbo, ma kpọkukwa ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu ka ha na-akwàlite omenala, ọdịnala na njirimara Igbo, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo.

Ọkpụkpọoku a bụ isi sekpụ ntị n'àgbà nke abụọ nke mmemme Nkụzi Oziọma Ọdịnanị (bụ 'Oziọma Ọdịnanị Lecture Series'), nke a kpọrọ 'Ka Anyị Tụọ Alo 2021', bụkwa nke weere ọnọdụ n'Ọba Akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

N'okwu mmalite ya n'ebe ahụ onyenhàzi ihe mmemme ahụ ma bụrụkwa onye na-eme ihe mmemme Oziọma Ọdịnanị n'ikuku n'ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service' (ABS, 88.5 FM), bụ Maazị Chukwubụdike Ụgbaja kọwara na mmemme ahụ bụ nke ha na-anọ na ya wee na-akparịta ụka, na-atụ arò na-awa okwu àgbà, dịka o siri metụta ọnọdụ, nkwalite na nchekwa omenala Igbo, ọdịnala Igbo na ihe dị icheiche e jiri mara ndị Igbo.

O kelere ụlọọrụ 'Anambra Newspapers and Printing Corporation', ANPC (bụ ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra); ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service' (ABS); ndị ihe Oziọma Ọdịnanị na-amasị, na ndị ọzọ sonyegoro ma na-akwàdo ihe mmemme ahụ kemgbe ahọ olenaole gara aga, ma dụzie ndị Igbo ọdụ ka ha jiri ọdịnala ha kpọrọ ihe.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi Ọba Akwụkwọ Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze rụtụrụ aka n'ụfọdụ ọrụ dị icheiche ọba akwụkwọ ọhaneze na-arụ n'ịkwàlite na ichekwaba asụsụ na omenala Igbo, ma kpọkuo onye ọbụla bụ nwa afọ Igbo ka o tinye aka n'ọrụ ma tụnyekwa ụtụ nke ya n'ichekwa asụsụ Igbo ka ọ ghara ịnwụ dịka òtù mba ụwa UNESCO siri buo n'amụma nà asụsụ ahụ ga-anwụ oge adịghị anya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service', Dọkịta Uche Nworah gbàrà akaebe na atụmatụ ahụ na-agawanye n'ihu ma na-achọkwazị ịghọ nnukwu òtù; ọbụladị dịka o kwere nkwà na ụlọọrụ ABS ga-aga n'ihu na-akwàdo atụmatụ ahụ. O tòkwàrà ịmamma nke ọnatarachi na omenala Igbo.

N'akụkụ nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra Newspapers and Printing Corporation' (ANPC), Maazị Chuka Nnabuife wepụtara atụmatụ 'Lataba'/'Nataba', bụ nke yiri atụmatụ Akụ Ruo Ụlọ, ma kpọkuo ndị Igbo ka ha cheghachi echiche azụ ma laghachi azụ na mgbọrọgwụ ha, bụ omenala ha, bụkwazị nke ọtụtụ n'ime ha na-agbakụtazị azụ n'íké n'íké ugbua ma na-agbasòzị omenala ndị ọcha.

O chètààrà Ndị Igbo na ọdịmma na ọdịnihu omenala Igbo dị n'aka aha, maka na o nweghị onye ga-ahapụ omenala nke ya bịa ichekwara ndị Igbo nke ha.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, onye na-eme ihe mmemme Ifeọmamebe n'ikuku n'ụlọ mgbasaozi ABS 88.5 FM, bụ Maazị Ifeomamebe Orjiako; onyeisi ụlọọrụ 'OVUS Engineering Limited', bụ Injinia Obi Vincent Ugochukwu; onyeisi ụlọọrụ 'Zero Energy Healing Touch' ma bụrụkwa onye chọpụtara òtù Ụmụ Anyanwụ Ọra, bụ Maazị Arinze Aghaeze; onye na-eti egwu, bụ Maazị Ndubuisi Ibemesi kelere ndị chịkọbara ihe mmemme ahụ maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, ma kpọpụtasịa ọtụtụ uru dị icheiche dị n'ịlaghachi azụ n'omenala Igbo.

E wezuga nkụzi dị icheiche e nyere na mmemme ahụ, a nọkwara na n'ebe ahụ mee ihe ngosi site n'aka ndị òtù dị icheiche, ma mekwa asọmpi ịwa ọjị, bụ nke ụmụakwụkwọ mahadum mere, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484