Ihu Ọchị Awaala Ndị Ọkụ Ochanja Metụtara

Nov 21, 2019 - 20:58
Jan 24, 2021 - 05:09
 0
Ihu Ọchị Awaala Ndị Ọkụ Ochanja Metụtara

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Dịka akwa na-ada elu na ala n'ahịa ihe karịrị otu ọnwa gara dịka ọkụ gbariri ma gbuo ọtụtụ mmadụ oge otu ụgbọala bu mmanụ ụgbọala dara ma nwuru ọkụ n'ahịa Ochanja, akụkọ ahụ agbanwela ugbua ọ bụla dịka gọọmenti Anambra Steeti na ọtụtụ otu ndị ọzọ na ndị mmadụ gbatara ọsọ enyemaka iji were hụ na obi agbawaghị ndị ọkụ ahụ metụtara.

Aka na-achị Anambra Steeti, Willie Obiano, nọrọ ụbọchị Wednezdee wee were nde otu narị naira were tie ndị ahụ ọkụ ahụ metụtara aka n'obi. Ọtụtụ ndị gwara ha okwu rịọrọ ha ka ghara ile anya n'ego enyere ya maka o nweghị ole pere mpe ma ọ bụ buo ibu iji kwụghachi ihe ha gbara ọkụ. A gbara ha ume ka ha tinye okwukwe ha n'ebe Chineke nọ bụ onye nanị ya pụrụ ị kasị ha obi.

N'okwu ya, Odeakwụkwọ Kọmitii Gọvanọ maka Ọkụ Ochanja, bụkwa onyeisi Ụlọọrụ Ọsọ Enyemaka Anambra Steeti, Maazi CY Agupugo, gwara gọvanọ na kọmitii ahụ tinyere anya na mmiri were nyochaa ma zute ndị niile ọkụ ahụ metụtara were nweta mmadụ narị isii na iri isii na atọ. O kwuru na ọkụ ahụ gburu mmadụ isii ebe ọtụtụ ndị bụ ndị nọ n'ụlọ ọgwụ enweta ọgwụgwọ. O kelere aka na-achị steeti ahụ maka imezu nkwa ya ikwado ụlọọrụ na-emenyu ọkụ n'ahịa ahụ site n'inye ha ngwa ọrụ.

N'otu aka ahụ, onyeisi ndị na-azụ ahịa, Ojukwu kelere gọvanọ ahụ maka enyemaka ya tupu Ekeresimesi eruo dịka o kwere ná nkwa. Ọ rụtụkwara aka ná Ngalaba Steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ na-eleta ọrụ ụzọ bara n'ahịa ahụ na nkwa ya na ụzọ niile banyere ahịa ahụ bụ nke ga-adị mma.

N'okwu ya, gọvanọ nọrọ oge ahụ were gosi nwute ya nye ndị ahụ ọkụ ahụ metụtara. "Na mkpụrụ ụbọchị iri na isii, afọ 2019, nnukwu ọdachi dachibidoro anyị. Nnukwu ọkụ wakporo anyị were gbuo mmadụ isii na ọtụtụ ndị ọzọ nọ n'ụlọ ọgwụ. Anyị akwụọla ụgwọ ụlọ ọgwụ ndị nọ n'ụlọ ọgwụ. Maka mmadụ isii nwụrụ anwụ, anyị ga-enye ezinaụlọ ha ego gbara ọkpụrụkpụ. Mana n'ehihie, a ga m enye ihe karịrị nde otu narị naira. Ọ dị mkpa k'anyị mata n'etiti mmadụ narị isii na iri isii na atọ n'ime ụnụ, anyị anaghị akpa oké ọ bụla. N'agbanyeghị steeti gị ma ọ bụ agbụrụ gị, ọ bụrụ na ngwaahịa gị so ná nke ọkụ gbara, ị ga-enweta ego nke gị," Obiano kwuru.

Gọvanọ ahụ gakwara n'ihu were kwuo na o nweghị ego ole buru ibu iji wepụ nwute nke ihe ọkụ ahụ gbara mana ihe gọọmenti mere bụ iti ha aka n'obi ma si ha ka ha tinye olileanya ha na Chineke maka ọ bụ nanị ya pụrụ iwepu nwute ha kpam kpam. Gọvanọ ahụ kwukwara na ndị niile nwetara mmerụ ahụ ga-enweta narị naira puku ise n'isi onye ọ bụla na-etinyeghị ụgwọ ụlọ ọgwụ ha.

Ị ga-echeta na Gọvanọ Obiano nọrọ n'oge ụtụtụ soro ná nkwanye ùgwù ikpeazụ nke Oriaku Deborah Obi, bụ nwaanyị ọkụ gbara ya na nwa ya nwoke ebe ọ rịọrọ Chineke ka o nye mkpụrụobi ha ezumike na ndụ ebighị ebi.

N'akụkụ nke ọzọ, ndị Ụkọchukwu ụka catholic bụkwa ndị zutere ndị ahụ ọkụ ahụ metụtakwara. Ha jiri ego karịrị nde naira iri abụọ na ise were kpere ndị ahụ ekpere ma kpokue Olisa ka ọ kasie ha ndị niile nke ahụ metụrụ obi. Mmadụ ndị ozi dịka aka chiburu Anambra Steeti n'oge mbụ, Maazi Pita Obi, Sinatọ Ifeanyi Ụba, nwa afọ Anambra na-eme ihe onyonyo, Zubby Michael, bụkwa ndị soro tie ndị ahụ aka n'obi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.