Ihe Mberede Okporo Ụzọ: Ndị Ntorobịa Ejirila Iwe Suo Ụgbọala Bu Àkpà Nnu Ọkụ n'Ọnịtsha

Nov 12, 2020 - 15:46
Jan 30, 2021 - 15:47
 0
Ihe Mberede Okporo Ụzọ: Ndị Ntorobịa Ejirila Iwe Suo Ụgbọala Bu Àkpà Nnu Ọkụ n'Ọnịtsha

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ bụrụ na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ejiri ya mere anụ ma n'udummiri ma n'ọkọchị.

Ọ bụ n'ịgbaso nke a ka ụmụokorobịa jiri were iwe gbaa otu nnukwu ụgbọala àkpà nnu jupụtara n'ime ya ọkụ n'Ọnịcha, dị na steeti Anambra maka ịkụgbu otu onye na-akwa barò n'Ọnịcha n'ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n'ebe ahụ.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti Anambra, bụ Maazị Kamal Musa kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụrụ na nsonso a banyere nke ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara n'ụtụtụ ụbọchị Tuzdee, ma bụrụkwa nke nnukwu ụgbọala ahụ, bụ ụgbọala Dangote (enweghị akara efere ọbụla) sitere na ya wee kụgbuo ya bụ nwa amadi na-agbara onwe ya mbọ n'Ọnịcha, na nso ụlọ ọba ego Zenith, na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịcha gaa Owerri.

 Ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na-akọwa na ọ bụ ịgba oke ọsọ mere ihe mberede okporo ụzọ ahụ jiri dapụta, n'ihi na ọ nọ n'oké ọsọ, nke mezịrị ka ọ pụọ na mpaghara ụzọ ebe o kwesiri ịgba, wee kwọrikọọ ya bụ nwata nwoke ahụ ebe ọ na-agara onwe ya, nke mere na ọ nwụrụ ozigbo ozigbo ahụ.

Nwata nwoke ahụ ọ kụgburu bụ onye a ma ama na mpaghara ebe ahụ, nke mezịrị ka ndị mmadụ gbapụtasịa ma gbara gaa n'ebe ahụ ozigbo. Mana oge ha rutere n'ebe ahụ, ha ahụghịzị onye na-anyà ya bụ ụgbọala, n'ihi na eleghị anya, ọ bụrụ na ọ sarụọla, ma pụọ n'ìkùkù.

Nke a mezịrị ka ndị ntorobịa ahụ jiri iwe suo nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ ọkụ ozigbo, ya na ngwaahịa (àkpà nnu) niile juru n'ime; ha niile wee gbaa pịàpịà, ghọọ ntụ.

Maazị Musa mezịrị ka a mara na ndị ọrụ FRSC nọ na mpụga Upper Iweka gbaara gaa n'ebe ahụ, mana ndị ntorobịa ahụ jiri iwe wee gbachibido ha ma nye ha ọsọ. Ha bụ ndị ntorobịa burukwàrà ozu nwata nwoke ahụ wee pụọ. 

Akụkọ kọkwara na ụfọdụ ndị omekome jiri ohere ahụ wee zuo ụfọdụ àkpà nnu, ma lariere onwe ha, maka na ala adịghị mma bụ uru ndị nze.

N'okwu ya banyere ihe mberede ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ Maazị Andrew A. Kumapayi kasìri ezinụlọ onye nke ha nwụrụ obi ma kpee ka Chineke nabata mkpụrụobi nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ma mekwa ka o zuru ike na ndokwa. 

Ọ kpọkuzịkwara ndị na-anya ụgbọala ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, ma nye ndị ji ụkwụ aga ndụmọdụ ka ha na-esi n'ebe ahụ a rụrụ maka ndị ji ụkwụ wee na-agafe oge ọbụla, karịa ịgbafe n'etiti iro, n'ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ na-ewetakarị ihe mberede okporo ụzọ na ọnwụ mberede.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.