Ịhe karịrị mmadụ 60 anwụọna n’Afganistan

Ịhe karịrị mmadụ 60 anwụọna n’Afganistan

Oct 20, 2017 - 06:21
Jan 20, 2021 - 06:21
 0
Ịhe karịrị mmadụ 60 anwụọna n’Afganistan
: :
playing

Ndị agha iyi egwu egbuona ịhe karịrị mmadụ 60 na Kabul yana Ghor. N’ụbọchị Fraịdee, abalị 20 nke ọnwa Ọkụtoba, ndị uwe ojii na Kabul kwuputere n’otu nwoke buuru egbe chịrị mgbọ gawa n’ụlọ okpukpere chi ndị ụka alakụba Shịa.

Nwoke ọjọọ ahụ kwara mgbọ megide ndị bịara ekpere, gbuo ọtụtụ n’ime ha, ma merakwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

Mmadụ 30 ka a gụtara dịka ndị nwụrụ anwụ, ebe ịhe karịrị mmadụ 45 bụ ndị merụrụ ahụ.

Ndị otu ISIS ekwetego n’ọ bụ ha kpara mkpamkpa ahụ megide ndị agbụrụ Shịa na Kabul.

N’akụkọ yiri ibe ya, Mohammad Ikbal Nezami, ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii na Prọvịnsụ Ghor, ekwuona otu nwoke jiri mgbọ ogbunigwe soo onwe ya jere n’ụlọ ụka ndị alakụba kpasuo mgbọ ugbunigwe ya.

Nwoke ahụ gburu onwe ya, gbukwee ọtụtụ ndị ọzọ bịara na mọskụ ịkpe ekpere. Ịhe karịrị mmadụ 33 ndị agbụrụ Sunni nwụrụ site na nwakpo ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.