Igba Odibo N’oge Ugbua

Sep 24, 2021 - 23:01
Sep 24, 2021 - 23:03
 0
Igba Odibo N’oge Ugbua


Chinwendu Uzoatu dere edemede a


IGBA odibo bụ ihe dịbara gboo. O si n’aka nna nna anyị wee ruo anyị aka.

  Odibo dị iche  n’ohu. Odibo bụ mmadụ ịhapụ ụlọ ya gaa biri be mmadụ, nọdụ n’okpuru onye ahụ ma na-asọpụrụ onye ahụ. Nke a pụtara na ọ ga-eme ihe nile nna ya ukwu gwara ya mee ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị. Iwu ji ya ịnọ n’okpuru nna ya ukwu. Ihe dị iche n’ebe odibo na ohu nọ bụ na odibo ga-emechaa nwere onwe ya, ma ohu na-anọgide n’okpuru nna ya ukwu.

  E nwere ike gbuo ohu mgbe ọbụna.Odibo ọbụna chọrọ ibara onwe ya uru na-enwe nsọpụrụ na irube isi makana ndị Igbo kwuru okwu si na onye fee eze, eze e ruo ya.

  Ana agba-odibo n’ụzọ dị iche iche. Ụfọdụ na-ahapụ be nne na nna ha mgbe ha dị na nwata gaa biri be onye ọzọ na-ejere onye ahụ ozi. N’ọnọdụ dị otu a, ọ bụ oke na ọlụ ndị ahụ ilekọta nwata ahụ anya dịka ọ na-agbara ha odibo.  

  N’ụzọ dị otu a, ezinaụlọ a ga-ahụ na nwata ahụ (odibo) ga-anọ n’aka ha topụta ihe e ji mmadụ eme ma bụrụkwa mmadụ n’obodo. Ụfọdụ ndị mmadụ e sila n’ụzọ dị otu a too, soro na ndị ọnụ ruru n’okwu n’obodo n’ihi na ha gbara odibo nke ọma.

  Ụzọ ọzọ e si agba odibo bụ mmadụ ịga binyere mmadụ mgbe o ruru ihe e ji mmadụ eme ka o wee nweta ihe ọ ga-eme iji wee kwụrụ n’onwe ya. Ima atụ, dimkpa na-aga be mmadụ biri, gbaa odibo ahịa. Nke a bụ iji mụta ahịa nna ya ukwu na-azụ ka o wee zụba ụdị ahịa ahụ. Na ụdị odibo dị otu a, a n-enwe afọ ole odibo na-anọ n’aka nna ya ukwu. Mgbe afọ ndị ahụ gachara, nna ya ukwu ga-edu ya ụlọ.

  Odibo dị otu a ga na-agba mbọ nke ukwu n’ahịa ahụ ha na-azụ makana ọ bụ site na mbọ ya ka a ga-eji duo ya ụlọ. N’ọnọdụ dị otu a, mmadụ na-esite n’ịgba odibo buru nnukwu ọgaranya.

  Ụzọ ọzọ esikwa agba odibo bụ mmadụ ibinyere mmadụ, nọdụ n’okpuru ya, na-asọpụrụ ya ma na emekwa ihe a gwara ya mee, ka o wee na-enweta ego. N’ụdị nke a, a na-akwụ odibo ụgwọ site n’ego. Nke a pụtara na ọ na-alụ ya dịka ọlụ oyibo.

  N’ụdị odibo dị otu a, okenye nwere ike ịgbara nwata ọ tọrọ atọ odibo. Nwata nwanyị nwere ike mụọ nwa, kpọta okenye ka ọ na-ekuru ya nwa ma na ejere ya ozi. Okenye ahụ ga na-alụ ọlụ ya ma na-anara ụgwọ ya dịka ha si kpaa.

  Ọdị ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ e si agba odibo mana nke bụ eziokwu bụ na mmadụ na-esite n’ịgba odibo nweta ezigbo ihe makana ọ bụ nwa ewu sepkuru ala, ọñụta nne ya ara.

  Mana n’ime ihe nile, ihe ọbụna nwere uru nwere ọghọm. Ọghọm dị n’ịgba odibo bụ na mgbe ụfọdụ ka mmadụ na-ezute mmegbu na mkpagbu n’aka onye ọ na-agbara odibo, makana a sị na ọnụ ejiri bite akụ abụghị ya ka e ji akwụ. Ụfọdụ ndị mmadụ anaghị emejupụta ihe ha na ibe ha kpara tupu amalite gbaba odibo.

  N’oge ugbua, ọtụtụ ụmụaka na-agba odibo ka a na-ahụtakari ebe ha na-ebughari ahịa na-aga n’okporo ụzọ na n’ọdụ ahịa dị iche iche, mgbe ha kwesiri ịnọ n’ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ ka a na-akwu agụụ ebe ụfọdụ na-enweta mmeru ahụ dị iche iche.

  Akụkọ kọrọ ka otu nwanyị siri were aka nwaodibo ya tinye na mmiri ọkụ, aka nwata ahụ wee gbagọọ. Nke a wee soro n’ọdachi a na-enwetazi n’ịgba odibo n’oge ugbua.

  Ọtụtụ ndị na-agba odibo ahịa ka ọ na-abụ o ruo oge a ga-edu ha ụlọ, nna ha ukwu ebo ha ebubo nke ga-eme ka ọ gharazie idu ha ụlọ. Ọtụtụ odibo esila otu a gbara aka lọta be nne na nna ha ka ha gbachara odibo ọtụtụ afọ.

  Odibo ụfọdụ ezutekwana ọnwụ ha site n’aka nna ha ukwu makana ọtụtụ ndị ọgaranya na-eji ndị odibo ha agwọ ọgwụ ego. Mgbe nke a mere, ha nwere ike sị na a na-achọ odibo ahụ achọ.

  Ụfọdụ odibo a na-akwụ ụgwọ na-ahusikwa anya n’oge ugbua. Ụfọdụ ka a na-eri ego ha ma bochie ha ọnụ,ebe ụfọdụ na-ezutekwa ọnwụ ha n’ụzọ dị iche iche. Ihe mere odibo ahịa nwekwara ike ime odibo a na-akwụ ụgwọ. Nna ha ukwu ma ọ bụ nne ha ukwu nwekwara ike iji aka tigbuo ha.

  Ka a na-ekwu maka ndị ọga ka a na-ekwukwa maka nsogbu si n’aka ndị odibo abịa. Ụfọdụ ndị odibo na-enyekwa nsogbu dị egwu. Ụfọdụ na-etinye nkewa n’ezinaụlọ ha batara. Ọtụtụ n’ime ndị odibo ekewaana dị na nwunye. Ọtụtụ ụmụnwanyị esitena n’ịgba odibo tụrụ ime n’aka nna ha ukwu ma si otu a chụpụ nwanyị nwe ụlọ.

  Na nwa mgbe gara aga ka e jidere otu nwanyị ya na odibo ahịa dị ya maka na di ya jidere ha n’elu akwa ya. Nke a wee bụrụ ihe jọgburu onwe ya.

  Odibo dịka ọ dị n’oge ugbua, kwesiri ka onye ọbụna hie asaa ‘anya lebara ya anya makana ajụghị ajụ eri na-ebute arịaghị arịa anwụ. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484