Ịgba Mgba

Jul 11, 2021 - 21:24
 0
Ịgba Mgba


 Josephine Maduakonam

N’OGE ochie, nna nna anyị ha na-ewere igba mgba dịka ihe ukwu. Ha na-eji ya mara mba nke nwere ike karịa ibe ya. N’agbanyeghị nke a igba mgba na- eme ka obodo mata ibe ya, na emekwa ka obodo na-enwe mmekọrịta. Ọnọdụ o nwere oge gara aga dịka nke bọọlụ nwere ugbua. Igba mgba na-eme ka ụmụaka sie ike n’ihi na ọ bụ otu ụzọ ha sị emesagharị arụ.

A na-esite na gboo kuzibere ụmụaka mgba ọ bụladị mgbe ha dị arọ anọ ma ọ bụ ise. Ụmụaka nọdụ n’aja uzuzu na mgbede, ndị tọrọ ha na ndị okenye ndị ọzọ biara inopụrụ oge a na-akụziri ha aka mgba.

N’ebe ụfọdụ, ọ na-abụ omenala na onye gafee n’ama, ayọọ ya mgba, na ọ ga-agariri mgba tumadu onye jere ikwu nne ya. N’ebe ụfọdụ, a na-eme ya ka omenala nke bụ ịga mgba nwadiala.

E nwere ụdị mgba ọzọ nke a na-aga obodo ọzọ agba. Tutu gị agaa, ha ga-ezi ozi, kwue ụbọchị ha ga-abịa. Tutu oge erue, ndị ọ bụla nọdụ, ha a na-amu aka mgba dị iche iche ka ọ ga-abụ ha rue ka ha nwee mmeri. Otu mgba ọbụla na-enwe onye isi mgba nke ga-eduru ndị ọzọ wee jee mgba. Otu ọbụla ga-ebu egwu wee jee. E rue, a na-eti egwu, na-agba egwu n’otu n’otu. Ndị mgba na-agba, ndị njali anọdụ na-ajalite ha, na-asi ha jisie ike. Onye nwude mmadụ, ebulie ya too ya dịka dịmkpa.

Mgbe a gbasiri mgba, otu ọbụla were ọñụ laa n’obodo ha. Mgbe ụfọdụ aghara na-adị site n’ịzọ aka. Ihe ọzọ na-ebute aghara na mgba bụ a kọba obodo ọnụ.

N’ọtụtụ obodo, a na-agba dịka n’emume tụmadụ n’oge ọkọchi. A pụta n’ama n’izu emume a, a hụ ndị ogbe ka ha fibere mgbe n’ama; mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ naani ụmụnwoke ma ọ bụ ụmụagbọhọ. O nwere mmemme obodo ụfọdụ a na-eme agbakọọ n’obodo a na-agba mgba, ogbe na ogbe. N’eziokwu, mgba nọchiri anya futu bọọlụ n’ala Igbo n’oge gboo.

N’obodo anyị na Nigeria taa ọkachasi n’ala Igbo, mgba bụzị akụkọ mgbe ochie mana ọdịghị ihe anya mmiri mere anya. Ọ bụrụ na ndị gọọmentị anyị wepụta anya were ukwu chọọ ihe danyere na mmiri ihe ga-agbanwe karịa ka ọ dị na mbụ.

N’ihi nke a, o kwesiri ka kọmishọna na- ahụ maka  egwuruegwu mee ka ụmụokorobịa na ụmụagbọghọbia na- ahụta igba mgba dịka otu ihe dị mkpa na otu egwuruegwu n’obodo anyị dịka futubọọlụ ji bụrụ oke ihe dị mkpa ma bụrụkwa ihe ejiri mara obodo anyị bụ Nigeria n’ụbọchị taa.

Ya mere, ọ bụrụ na ndị okwu dị n’aka bụ ndị sitere n’aka kọmịshọna na- ahụ maka mgbasa ozi ga- ejikọ ọnụ wee hụ na atụmatụ a bịara na nmezu. Iji wee hụ na nke a mipụtara mkpụrụ a ga-eme mgbasa ozi a ruo ogbe na ogbe, obodo na obodo, n’ime okpuru ọchịchị dị iche iche n’ala anyị ọ kachasi n’ebo nke ala Igbo.

A na-eme nke a site n’ikpọkọba ụmụaka na ndị na- etolite etolite n’ama  ọ kachasi  oge emume iji akara nke onye nwere n’akụkụ nke ya ọ kachasi na ihe gbasara igba mgba.

Site n’igba mgba nke enyi na enyi, nwanne na nwanne, ogbe na ogbe, obodo na obodo ma ọ bụ  agburu na agburu, site na ime nke a na enyemaka nke ndị gọọmentị na ndị na-ahazi egwuruegwu igba mgba n’oge na-adịghị anya, anyị ga-adị ka obodo ndị ọzọ a maara amara n’egwuruegwu mgba.

Mgba dịka egwuruegwu ndị ọzọ na- eweta aka ọlụ. Mgba na- eweta ọganiru. Ọ na-eweta mmepe n’obodo, ọ na- eme ka obodo mara obodo ka ibe ya ike na mgba. Ọ na-emekwa ka ụmụokorobia na ụmụagbọhọbịa anyị nwee aka ọlụ ma mekwaa ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ. Mgba na- ewetakwa obi añụrị n’obodo ọ kachasị mgbe onye nke ha meriri.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484