Gọọmenti Anambra Ga-Anwụchi Onye Ọbụla Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ — Mezue

Gọọmenti Anambra Ga-Anwụchi Onye Ọbụla Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ — Mezue

Dec 21, 2020 - 00:35
Jan 19, 2021 - 00:36
 0
Gọọmenti Anambra Ga-Anwụchi Onye Ọbụla Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ — Mezue

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-adị mma ibu ụzọ ma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya.

N'ịgbaso nke a, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị n'ime steeti Anambra, bụ Oriakụ Ndidi Mezue adọọla aka na ntị ọzọ ma mee ka a mara na gọọmenti steeti ahụ ga-anwụchikọ ma kpụpụ ụlọikpe, onye ọbụla a hụrụ ka o ji ụmụaka arịọ arịrịọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ.

Kọmishọna Mezue kwupụtara nke a na nnukwu ọgbakọ gọọmenti steeti ahụ na ndị nnọchianya òtù jikọtara ndị abụghị ndị Anambra bi na steeti ahụ nwèrè, bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Kọmishọna Mezue, onye bụkwa onyeisioche na mmemme ahụ mère ka a mara na otu n'ime ebumnobi ya bụ ọgbakọ mkparịtaụka bụ iji wee tụọ atụmatụ banyere etu a ga-esi kpochapụ ịrịọ arịrịọ n'ezi na ụzọ steeti ahụ, bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-emezị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ugbua.

Ọ gbarụrụ ihu banyere etu ịrịọ arịrịọ sizị arị ibe ya elu ugbua na steeti ahụ, nakwa etu ndị mmadụ sizịrị jiri ya wee merezie aka ọrụ, ọkachasị ndị ụfọdụ n'ime ha na-eji ụmụaka kwesiri ịnọ n'ụlọakwụkwọ wee na-arịọ arịrịọ.

Ọ kọwara na ọkanọnụọgụ ndị na-arịọ arịrịọ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ abụghị ụmụafọ steeti ahụ, kwuo na ha bụ ndị sitere mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria na mpụga ya wee nubatasịa n'ime steeti ahụ ịrịọ arịrịọ. Ọ kpọkuzịrị ndị nnọchianya otu ahụ jikọtara ndị abụghị ndị Anambra bi n'ime Anambra ka ha tinye aka n'ọrụ ozigbo ịhụ na a kwụsịrị ya bụ ihe, maka na ọ bụ ebumnobi na mmasị gọọmenti steeti ahụ ịhụ na a machiri ma kwụsị kpamkpam, ihe ọbụla bụ ịrịọ arịrịọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ ugbua.

N'okwu nke ya n'ọgbakọ ahụ, onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị abụghị ndị Anambra bi na steeti ahụ, bụ Maazị Amos Nkwuda kelere steeti Anambra maka ihe dị iche iche ọ na-emere ha, maka inye ha ezi ọnọdụ dị larịị na ime ha mma na steeti ahụ, karịa imeso ha ka ha bụ ndị ọbịa.

Ọ gakwara n'ihu kelee steeti ahụ maka ịkpọ ha ka ha na ha kparịta ụka bànyere ya bụ okwu a kpụ n'ọnụ, karịa iji aka ike wee mee ihe ọbụla bụ uche ya, ma kwezie nkwà na ha ga-elebà anya n'ọnọdụ ahụ nke ọma, iji hụ na ya bụ ihe bịara n'isi njedobe, ebe ịhụ ndị arịrịọ n'ezi na ụzọ nke steeti ahụ ga-abụkwazị akụkọ mgbe ochie.

Na ntụnye nke ya, otu onye n'ime ndị sonyere na ya bụ ọgbakọ mkparịtaụka, bụ Maazị Victor Meji kwùrù na ọ dị mma ka ndị òtù ahụ buru ihe ahụ e kwuru maka ya n'ọgbakọ ahụ wee lakwuru ndị otu ha na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, iji mee ka ha mara banyere ya bụ okwu ma tụnyekwazie ọnụmmiri okwu nke ha na ya bụ atụmatụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.