Gọọmenti Anambra Anwụchikọọla Ndị Ọna Ụtụ Iwu Akwadòghị

Jan 22, 2020 - 20:53
Jan 24, 2021 - 01:54
 0
Gọọmenti Anambra Anwụchikọọla Ndị Ọna Ụtụ Iwu Akwadòghị

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, maka na ọ na-abụ a na-etigbu ọ ka na-arịsịta, ị mara na ihe a na-etigbu agwụbèghị n'ebe o si arịpụta.

N'ịgbasò nke a, gọọmenti steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ ruru iri na ise n'ọnụ ọgụgụ n'Ọnịtsha, bụ ndị a na-eyo èyo na ha bụ ndị ọna ụtụ iwu akwadòghị nà ndị na-ezufusi ego gọọmenti site n'ụzọ dị otu ahụ.

Ndị ahụ bụ ajọ nkịta ji isi anya ọkụ bụ ndị e kwùrù na a nwụchikọrọ site n'aka ndị òtù ọrụ ahụ e gùzobere ọhụụ maka ibu agha megide ihe dị otu ahụ, bụ ndị a maara dịka 'Focus Initiative Against Touting,' bụ FIAT n'aha ịchàfụ.

N'okwu ya oge ọ na-akpụgharị ndị ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Christian Madụbuko kọwàra na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya, bụ mmadụ ịdị na-ebugharị onwe ya dịka onye ọna ụtụ gọọmenti, wee si n'ụzọ dị otu ahụ na-anapụsị ụmụ mmadụ ego ha tara ahụhụ wee kpaa ma na-etinye n'akpa nke ya.

O kwuru na ndị òtù ọrụ ya ga-aga n'ihu ibu agha megide ndị na-etinye aka n'ihe dị otu ahụ, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ọhanaeze ka ha hie asaa n'anya, mụrụ anya ka azụ, ma gbaa mbọ wèta mkpesa n'aka ụlọ ọrụ ya, oge ọbụla ha hụrụ onye ọbụla a na-enyo ènyo na ọ na-etinye aka n'ihe dị otu ahụ, iji wee nwụchikọọ ndị arụrụ ala ahụ.

Ka ọ dị taa, a kpụpụgala ndị ahụ a na-enyo ènyò ụlọ ikpe mbugharị dị n'Ọnịtsha, bụ ebe a nọrọ wee kpee ha ikpe n'otu n'otu.
Mmadụ ndị ahụ, nke gụnyere Maazị Mike Chigbo, Afamefuna Ọnyịa, Abụchi Ogbuu, tínyere ndị ọzọ, ka e kwùrù na ha na-eresígasị ndị ji ụgbọala achụ ego akwụkwọ ikike aha gọọmenti steeti ahụ dị na ya, mana gọọmenti amaghị bànyere ya; ha wee sizie n'ụzọ dị otu ahụ na-ezu ụmụ mmadụ na gọọmenti ohi.

Ndị ahụ ka e kwuru na ha dàrà iwu dị n'àgbà nke iri isii na asaa, nkega Ch, nke amụma iwu nchekwa okporo ụzọ ahọ 1991 nke steeti Anambra.

N'akụkụ nke ha, ụfọdụ ndị na-ekpechitere ndị ahụ ọnụ ha, bụ Ọkaiwu Chigozie Amahakụ na Ọkaiwu Victor Alọ rịọrọ ụlọ ikpe ahụ ka a gbapụta ha, n'ihi na ha bụ ndị a pụrụ ịgbapụta agbapụta, n'ilekwàsị anya n'iwu ha dàrà.

Ka ọ dị ugbua, site na nkabì ụlọ ikpe ahụ, a nabàtàrà mgbapụta mmadụ ndị ahụ n'ótù n'ótù site n'ịna ha ego dị puku Naịra iri ise, n'otu n'otu, ịgwa ha kpọta otu onye akaebe n'otu n'otu, tinyere akwụkwọ ndị ọzọ a gwàrà ha wèta. Otu ọ dị, ótù onye n'ime ndị ahụ, bụ Maazị Chigbo bụzị onye a tụkpuru n'ụlọ mkpọrọ, wee na-echerezị nkabì ikpe n'isi ya.

A nwụchikọkwazịrị mmadụ iri na abụọ ndị ọna ụtụ ọzọ iwu akwadoghị n'otu ụbọchị ahụ oge ụlọ ikpe ahụ nwechara ọnọdụ ya ụbọchị ahụ, bụkwa ndị e kwuru na a ga-akpụpụkwa ụlọ ikpe oge adịghị anya, ebe a ga-eji usoro iwu wee nyụchaa ha anya.

Ihe ndị e nwèkọtara n'aka ndị ahụ gụnyèrè akwụkwọ ikike ahụ ha na-ere, ego nke ha rètàrà ereta, mkpịsị odéè nakwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.