Gọọmenti Anambra Anapụtala Ala Ya Ndị Mmadụ Kpààrà n'Ọnịshà

Jan 20, 2021 - 16:26
Jan 21, 2021 - 06:12
 0
Gọọmenti Anambra Anapụtala Ala Ya Ndị Mmadụ Kpààrà n'Ọnịshà

By Izunna Okafor

Ọkọchị gwara ndị na-akpara ala nna ya ka ha jisie ike, mana ọ bụ mgbe nwanne ya nwoke bụ udummiri batara, o were aka ya kwuo ebe ókè ala siri dị.

N'ịgbasò nke ahụ, gọọmentị steeti Anambra awụchiela n'Ọnịsha, wèé màlite ịnapụtasị àlà ya dị iche iche ụfọdụ ndị mmadụ iwu akwadòghị kpààrà ma rụọ ihe na ya, dịkà à gà-asị na ọ bụ ala obi ha.

Ọrụ ịnapụtàsị ala ahụ bụ nke a bagidèrè na ya site n'aka ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board (ANSPPB) site na njikọaka ụlọọrụ nchekwa na ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ dị iche iche.

Ọrụ ahụ, nke ọ bụ onyeisioche ụlọọrụ ANSPPB, bụ Ọkaiwu Chike Mmaduekwe duru ha wee bàgide, bụ nke a nọrọ na ya wee kụtuo aja ngwùrù onye iwu akwadoghị jiri wee gbachibido ala gọọmenti, bụ ala ebe gọọmentị wepụtara maka ịrụ ebe obibi ndị Ọkaikpe, ma bụrụkwa nke dị n'azụ ebe obibi Gọvanọ dị na mpaghara GRA, n'Ọnịshà ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, Ọkaiwu Madụukwe mere ka a mara na nke a bụ nke ugboro atọ ha na-aga ebe ahụ maka ala ahụ, ma gbarụọ ihu banyere etu ndị mmadụ siri kachie ntị na-aga n'ihu na-etinye aka n'ala gọọmentị, n'agbanyeghị ọkwà niile gọọmenti na-ama megide ihe dị etu ahụ.

O mere ka a mara na o teela ha jiri kwube okwu ala, kwuo na ha enyela ndị ahụ akwụkwọ ka ha sepu aka n'ala ahụ, ma wegakwa okwu gbasaara ala ahụ n'ụlọikpe, mana ndị ahụ añaghị ntị, kamà, ha kàchiri ntị na-arụ ihe n'ụzọ iwu akwadoghị n'ala ahụ, ma na-ewukwa aja ngwùrù n'ala ahụ iji gbachibido ya.

O mere ka a mara na gọọmentị steeti ahụ enweghị mmasị ọbụla n'imekpà mmadụ ahụ, kama na o nwere mmasị n'ijere ndị mmadụ ozi, ma kwuo na e nwere usoro iwu kwàdòrò mmadụ nwere ike isi nweta ala gọọmenti, karịa ime ya n'ụzọ iwu akwadòghị. Ọ gwakwazịrị ndị dị iche iche nke ahụ metụtara ka ha chere mpụtara na mkpebi ụlọikpe banyere nke ahụ.

N'okwu nke ya, onyeisi nhazi nke ụlọọrụ ANSPPB ahụ, bụ Maazị Anene Nwabufo gwara ndị na-arụ ihe ka ha gbaa mbọ na-eme nnyòcha nke ọma ma na-ajụkwa esè etu o kwesiri, tupu ha azụọ àlà, maọbụ màlite ịrụ ụlọ maọbụ ihe ọbụla ha na-arụ, ka ha wee ghara ịkwa 'ngara m mara' n'oge ikpeazụ.

Ndị òtù ọrụ ahụ nọkwazịrị n'ụbọchị ahụ wee kàá ụfọdụ ụlọ akàrà nkụtù na mpaghara 'Water Works and Savoy, Onitsha' ebe ndị mmadụ iwu akwadòghị rụrụ ihe dị iche iche n'ala gọọmenti.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.