E Liela Ozu Nna Chimamanda Adichie n'Abba

Oct 18, 2020 - 00:32
Jan 25, 2021 - 00:33
 0
E Liela Ozu Nna Chimamanda Adichie n'Abba

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ọnwụ bụ eze a ma na a ga-echi ma bụrụkwa ihe na-echere mmadụ ọbụla dị ndụ, kama, ihe kacha mkpa bụ ihe onye ahụ mepụtara n'ụwa wee nwụọ, na ebe mkpụrụ obi ya na-aga ịnọ ọnọdụ ikpeazụ.

Nke a bụ isi sekpụ ntị n'okwuchukwu Bishọọpụ Jonas Benson Okoye nke ụka katọliiki na dayọsis Awka, na mmemme elimozu Ọkammụta James Nwoye Adịchie, bụ nna otu nwaanyị na-ewu èwù n'ide akwụkwọ na mba ụwa, bụ Chimamanda Ngọzị Adịchie.

Ụka mmemme akwamozu ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ụka 'St. Paul' dị n'Abba, n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke Ọzịlarị Bishọọpụ Okoye nọ n'isi ya. 

Ya bụ mmemme akwamozu bụ nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere Gọvanọ chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara, bụ Maazị Peter Obi, onyeisi mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ Ọkammụta Charles Esimone, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na ngalaba mmụta na ngalaba ndị ọzọ, ndị ọrụ gọọmenti, òtù ahụ jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'Anambra a maara na bekee dịka 'Society of Young Nigerian Writers' (ngalaba ya nke Anambra), tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ Okoye kọwara Ọkammụta Adịchie lagoro mmụọ dịka nwoke obi umeala, onye udo, nakwa onye jiri ọgụgụisi ya na akụnụba ya wee jeere Chineke na ụmụ mmadụ ozi n'ogologo ụbọchị ndụ ya niile, wee ruo n'ọnwụ. Ọ kpọkùzịrị ndị dị ndụ ka ha bie ezi ndụ ma jeere Chineke na mmadụ ozi ugbua ha ka nọ n'ụwa, n'ihi na nke ahụ ga-eme ka ụmụ mmadụ ñụrịa ọñụ ma gbaa ezi akaebe bànyere ezi ndụ ha biri, ebe Chineke ga-enyekwa ha ezumike udo ebighịebi n'alaeze Ya mgbe ha hapụchara ụwa.

N'okwu nke ya, Chimamanda Ngozi Adichie kwuru na nna ya bìrì ezi ndụ kwesiri nñòmi ma bụrụkwa nwoke nwere ezi ịhụnanya, nàkwà ụdị mmadụ onye ọbụla ga-enwe mmasị inwe dịka nna. O kwuru na ya bụ agụ nwoke na-ewepụta ogè maka ha bụ ụmụ ya oge ọ nọ ndụ, ma kọwaa na ọ bụkwa nkwàdo na ezi ntọala nna ya nyere ya mere o jiri bụrụ ihe ọ bụ taa.

Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche nna ya mepụtara mgbe ọ dị ndụ, ezi nzọụkwụ ọ tọgbọọrọ ha, nakwa ezi ihe dị iche iche ọ hapụụrụ ha wee laa mmụọ, ma kwaa arịrị na ọ bụ nnukwu ihe mwute na ihe mgbọwa obi nyéré ya ugbua ọnwụ kewàpụgoro ya, nke na ọ gaghị ahụzịkwa ya anya ọzọ n'ụwa a.

Na ntụnye nke ya, Gọvanọ Chịbụrụ Steeti Anambra n'oge mbụ, ma bụrụkwa onye jiri aha otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party (PDP)' wee zọọ ọkwa osote onyeisi ala Nigeria na nhọpụta izugbe ahụ e mere n'ahọ gara aga, bụ Maazị Peter Obi kwuru maka nzute na mbịakọrịta ya na Ọkammụta Adịchie oge ọ dị ndụ, ma gbaa akaebe na ọ bụ nwoke udo na nwoke e ji ama atụ ezi ihe.

O kwuru na ya bụ nwoke mepụtara ọtụtụ ihe ọma dị iche iche ụwa na-agba akaebe ya taa, ma kwuo na nke kacha nke bụ na ọ hapụụrụ ụmụ ya ezi nzọụkwụ, udo, nakwa ihe nlereanya. O kpekwazịrị ka Chineke kasie ezinụlọ ya obi, ma nyekwa ya mkpụrụ obi ya bụ nwoke ezumike udo n'alaeze ya.

Ọkammụta Adịchie, onye a na-akpọkarị n'aha echichi ya 'Odelọra' nwụrụ ụbọchị Wenezdee, abalị iri nke ọnwa June ahọ a, ma bụrụkwa onye gbara ahọ iri asatọ na asatọ tupu ọ laa mmụọ. Ya bụ agụ nwoke bụkwa onye mbụ ruru ogoogo Ọkammụta n'ihe ọmụmụ 'Statistics' n'ala Nigeria niile, ma bụrụkwa onye nwa ya nwaanyị, bụ Chimamanda Adịchie degoro ọtụtụ akwụkwọ, nweta ọtụ nkwanyeùgwù ma bụrụkwa onye na-ewu èwù na mba ụwa n'ide akwụkwọ.

Ndị Ọkammụta Adịchie hapụrụ ná-eru uju ya gụnyèrè nwunye ya, bụ Oriakụ Grace Ifeoma Adichie; ụmụ ya, bụ: Ijeoma Adichie, Uchenna Adichie, Chuks Adichie, Okey Adichie, Chimamanda Adichie, na Kenechukwu Adichie; tinyéré ụmụ-ụmụ ya na ọtụtụ ndị ikwu na ibè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.