A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Sepu Aka n'Ọgwụ Ike

Jul 8, 2021 - 19:25
Jul 8, 2021 - 19:25
 0
A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Sepu Aka n'Ọgwụ Ike

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ụmụakwụkwọ ọdụ ka ha sepu aka n'ihe ọbụla metụtara ịñụ, ịkpọ, isè, ịgba, ịtụ mgbere maọbụ itinye aka n'ihe ọbụla metụtara ọgwụ ike, iji wee gbanahị ịkwa 'M gara m mara' n'oge ikpeazụ, ya na iji zèéré maọbụ gbanahị ihe égwù ndị ọzọ dịgasị na ya.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi n'okwu na mmemme imerubè Ụbọchị Ibu Agha Megide Ọgwọ Ike Na Ịtụ Mgbere Ọgwụ Ike Na Mba Ụwa, nke 2021, bụ nke ọba akwụkwọ ahụ chịkọbàrà site na njikọaka ụlọọrụ 'Enforcement Agency, NDLEA', ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'Abagana, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka, ya na Mkpologwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Agụata na steeti Anambra. 

N'okwu ya n'ebe ahụ, Dọkịta Udeze mèrè ka a mara na ọba akwụkwọ ahụ chịkọbara ya bụ mmemme dịka otu n'ime mmemme dị iche iche ha na-achịkọba iji nwogharịa ma gbanwee akparamagwa ndị mmadụ na etu ha si ebi ndụ, ma bụrụkwa ndị na-ewèta ezi mgbanwe n'obodo, site n'ịkụziri ha ihe dị iche iche ha kwesiri ịma.

Oge ọ na-adụ ha ọdụ ka ha gụsibe akwụkwọ ha ike iji mee nke ọma n'agụmakwụkwọ ha, ọ gwakwàrà ụmụakwụkwọ ahụ na ọba akwụkwọ bụ maka onye ọbụla, ọkachasị ndị dị ka ha. Ọ gwara ha na ọba akwụkwọ ahụ chọrọ ka ha buru ndị ga-aba uru n'obodo, karịa ịnwụ ọnwụ ike, iwetara nne na nna ha na ezinụlọ ha ihe ihere maọbụkwanụ nwụọ n'ụlọ nga, bụkwazị nke ya bụ ọba akwụkwọ ji ahazi ọmarịcha mmemme ahụ na mmemme ndị ọzọ dị etu ahụ ha na-ahazi.

Ọ kpọkuziri ụmụakwụkwọ ahụ ka ha sepu aka n'ihe ọbụla gbasaara ọgwụ ike, ma tinye uchu n'agụmakwụkwọ ha iji baara onwe ha na obodo ha uru. Ọ gwara ndị nne na nna ka ha na-akụnye ezi omume na mmụọ ịgụ akwụkwọ n'ime ụmụ ha; na-elerukwa ha anya oge niile iji mara ihe ha na-etinyesi aka na ya, ma na-enyekwa ha ntaramahụhụ kwesiri ekwesi oge ọbụla ha metara ihe kwesiri nke ahụ. Ọ dụkwara ndị nkụzi ka ha kwụsị ịkwàdòrò ụmụakwụkwụ izu ohi n'ule.

Dọkịta Udeze gakwara n'ihu kpọkuo ndị obodo ahụ ka ha na-aga n'ọba akwụkwọ ahụ oge ọbụla, ma na-agakwa ebe e nwere ụdị ọgbakọ nkuzi dị etu ahụ iji mụta ihe ga-enyere ha aka na ndụ niile, karịa ịdị na-aga naanị ebe a ga-eke ha ego maọbụ akpa osikapa, bụ nke na-adị naanị nwa mgbe ntà.

Na mbụ na nkụzi ya, otu onye selitere isi n'ụlọọrụ NDLEA na steeti Anambra, bụ Dọkịta Chinwe Thompson kọwàrà ọgwụ ike dịka ọgwụ ike dịka ihe ọbụla nwere ike ịkpali mmadụ maọbụ gbanwee etu o si eme omume mgbe ọ bara ya n'ahụ. Ọ kpọpụtasịkwara ụdị ọgwụ ike dị iche iche, na ụzọ dị iche ndị mmadụ si emetọ ọgwụ maọbụ na-etinye aka n'ihe metụtara ọgwụ ike.

Ọ kpọpụtasịrị, kọwaa ihe dị iche iche mere ụfọdụ ndị mmadụ ji etinye aka n'ọgwụ ike, ma kọwasịkwa ọtụtụ ihe egwù na mpụtàrà ọjọọ dị iche iche na-esi na nke ahụ apụta, ọbụladị dịka ọ dụrụ onye ọbụla na-eme ihe dị etu ahụ ọdụ ka o sepu aka na ya, n'ihi na o nweghị uru ọbụla na-esi na nke ahụ apụta, n'agbanyeghị etu ndị mmadụ si ahụta ya.

O kwuru na dịka mpụtàrà ndị òtù 'United Nations' wepụtara n'ahọ 2020 siri kọwaa, nà mmadụ ruru narị ndè atọ na iri anọ na asatọ na mba ụwa na-etinye aka n'ọgwụ ike n'ụwa gbaa gburugburu, mmadụ ruru ijeri iri na otu na mba ụwa na-agba ọgwụ ike agba. Ọ sịkwa na mmadụ ruru nde iri na ise n'ala Nigeria na-etinye aka n'ọgwụ ike; mmadụ ruru nde iri asatọ na-akpọ ya akpọ; ebe mmadụ ruru nde iri na isii n'ọnụọgụgụ na-enwe nsogbu ụbụrụ sitere n'ọgwụ ike na mba ụwa n'ụwa gbaa gburugburu. Ọ gwakwazịrị ha na ọgwụ ike jọrọ njọ nke ukwuu, ma gwa ha ka ha tinye uchu nke ukwuu n'agụmakwụkwọ ha iji baara onwe ha na obodo ha uru.

N'okwu nke ya, onye DPO nke isi ụlọọrụ ndị uweojii na mpaghara Njikọka dị n'Abagana, bụ CSP Matthew Okafor, nke SP Ignatius Okafor nọchitere anya kọwaara ndị sonyere na mmemme ahụ ihe ha kwesiri ịma banyere ọrụ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n'ihe gbasaara ibu agha megide ọgwụ ike, ya na ihe dị iche iche a na-eme na ntaramahụhụ dị iche iche a na-enye onye ọbụla e jidere maka ọgwụ ike, dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu na-achị Nigeria, nke gụnyere ịnwụchi onye ahụ, ịkpọchi ya, ikpe ya ikpe, ịdà ya nha na ịtụ ya mkpọrọ, tinyere ntaramahụhụ ndị ọzọ. Ọ kpọkukwazịrị ụmụakụkọ ka ha bido ugbua gbabara ọgwụ ike ọsọ.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onyeisi ọchịchị obodo Abagana, bụ Maazị Linus Okafor Okunwa, na otu onye nọchitere anya Uru-Okpala Village Abagana, bụ Maazị Vincent Sunday Okeke kelere ọba akwụkwọ ahụ maka ịchịkọba mmemme ahụ nke ahọ a n'obodo ha, ma dụzie ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ ọdụ ka ha tinye ihe niile ha mụtàrà ebe ahụ n'ọrụ; ọbụladị dịka ha onwe ha kwere nkwà ịga n'ihu na-agbasa ozi megide ọgwụ ike.

Na ntụnye nke ha, odeakwụkwọ n'obi eze Mkpologwu, bụ Nze Eugene Ezeobi; onyeisioche òtù ọrụ na-ahụ maka ahụike n'obodo ahụ, bụ Nze Emmanuel Nwosu; na odeakwụkwụ ọchịchị obodo ahụ na odeakwụkwọ òtù na-ahụ maka agụmakwụkwọ, nkwàdo agụmakwụkwọ na ọba akwụkwọ n'obodo ahụ, bụ Ọkpara Nnamdi kọwara mmemme ajụ dịka nke magburu onwe ya, ma kelee ọba akwụkwọ ahụ maka ịchịkọba ya n'obodo ha. Ha dụkwàrà ụmụakwụkwọ ahụ ọdụ ka ha tinye ihe niile ha mụtàrà ebe ahụ n'ọrụ.

Ụfọdụ n'ime ndị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Chukwudi Rejoice na Nwobi Oluchukwu sitere ụlọakwụkwọ 'Girls Secondary, Abagana'; Agbanwoizu Chidiebere sitere ụlọakwụkwọ 'Nnamdi Azikiwe University Secondary School'; na Abaelu Chika sitere ụlọakwụkwọ 'All Saints Secondary School Abagana' gbara akaebe na ha mụtàrà ọtụtụ ezigbo ihe na mmemme ahụ, kelee ọba akwụkwọ Anambra na NDLEA maka ịchịkọba ụdị mmemme ahụ,  kwezie nkwà itinye ihe niile ha mụtara ebe ahụ n'ọrụ.

Isiokwu mmeme ahụ nke ahọ a bụ "Gbasaa Ozi Banyere Ọgwụ Ike, Zọọ Ndụ".

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484