Buhari Achụọla Ndị Isi Ọrụ Ngalaba Nchekwa, Kpọlite Ndị Ga-Anọchi Anya Ha

Jan 27, 2021 - 22:32
 0
Buhari Achụọla Ndị Isi Ọrụ Ngalaba Nchekwa, Kpọlite Ndị Ga-Anọchi Anya Ha

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ; ma sịkwa na ọ na-adị mma akpụ kwụọ ụdọ, a chọọr ya mmiri ịkwọ aka.

N'ịgbaso nke a, onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari achụtuola  mmadụ anọ bụ ndị isi ọrụ ngalaba nchekwa anọ dị iche iche, bụ ndị a maara dịka 'Service Chiefs' n'ọkwa, ma sị ha gazie zuo ike ka ndị ọzọ nwàkwa ike ha.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye onyeisiala n'ihe gbasaara magbasaozi, bụ Maazị Femi Adesina, bụ onye kụpụụrụ ndị nta akụkọ ozi na nsonso a banyere nke ahụ, nke o sitere na ya mee ka a mara na onyeisiala Buhari gwakwara ndị ahụ ka ha laa ezumike nke ozigbo ozigbo.

Adesina nyere aha ndị ahụ a chụturu n'ọkwa dịka 'General' Abayomi Olonisakin bụ onye ji ọkwa 'Chief of Defence Staff' nke pụtara onyeisi ndị ọrụ nchekwa gburugburu ala Nigeria; 'Lt-General' Tukur Buratai bụ onye ji ọkwa dịka 'Chief of Army Staff' ma bụrụ onyeisi ndị ọrụ agha ala Nigeria; 'Vice Admiral' Ibok Ekwe Ibas bụ onye ji ọkwa 'Chief of Naval Staff' ma bụrụ onyeisi ndị ọrụ agha mmiri; 'Air Marshal' Sadique Abubakar bụ onye ji ọkwa 'Chief of Air Staff' ma bụrụ onyeisi ndị ọrụ agha ìkùkù.

Dịka o siri kọwaa, onyeisiala Buhari kèlère ndị isi ọrụ a maka agbambọ ha na ntụnye ha mere n'iwètà udo tọrọ atọ na ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria oge ha nọ n'ọkwa, ma kpee ka ihe ndị ọzọ ha ga-etinye aka na ya n'ọdịnihu gaara ha ịke ọma.

Maazị Adesina mekwara ka a mara na onyeisiala kpọlitekwara ndị ga-anọchi anya ndị ahụ a chụturu n'ọkwa. O nyere aha ndị ahụ dịka 'Major-General' Leo Irabor, onye ga-eji ọkwa dịka 'Chief of Defence Staff'; 'Major-General' I. Attahiru, onye ga-eji ọkwa dịka 'Chief of Army Staff'; 'Rear Admiral' A.Z. Gambo, onye ga-eji ọkwa dịka 'Chief of Naval Staff'; na 'Air-Vice Marshal' I.O. Amao, onye ga-eji ọkwa dịka 'Chief of Air Staff'.

Ọ sị na Buhari nàrà ndị isi ọrụ ọhụrụ ahụ aka maka mkpọlite ahụ a kpọlitere ha, ma gwa ha ka ha jiri ọnụnụọkụ n'obi wee rụọ ọrụ ha n'ikwesi ntụkwasịobi, ma gbasikwa mbọ ike, iji wèta nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria n'isi njedobe n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.