Asọmpi Onwatifoluchi Njikoka: Nimo Ejirila Otu Ọ̀kpụ̀ Fọchie Abagana Ikè

Aug 29, 2021 - 23:21
Aug 29, 2021 - 23:23
 0
Asọmpi Onwatifoluchi Njikoka: Nimo Ejirila Otu Ọ̀kpụ̀ Fọchie Abagana Ikè

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Igbo sị na ọ na-abụ aka na aka hàrá, a kpọba Dianyị; ma sịkwa na ọ na-abụ dike zùte dike ibè ya n'ụzọ, a mara akanwụ na ụtaba nke na-akpọlite uzere.

Ka ọ dị taa, ndị òtù egwuregwu bọọlụ ụkwụ Nimo nọrọ na nsonso a wee jiri otu ọ̀kpụ̀ turu ùgò n'asọmpi egwu bọọlụ 'Ọnwatifolụchi Njikọka Unity Cup' nke ahọ 2021.

Àgbà nke egbe buru ọ laa nke asọmpi ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Theresa’s Catholic Church, Enugwu-Ukwu' dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikoka nke steeti Anambra; ma bụrụkwa nke a chịkọbàrà site n'okpuru òtù 'National Youth Council of Nigeria (NYCN), ngalaba Njikọka. Ya bụ asọmpi egwuregwu dọ́tárá ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù, bụkwà nke e mere site na nkwàdo Maazị Austin Oguejiofor, bụ onyeisi ụlọọrụ 'Rotech Energy Services Limited', na site na njikọaka ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service'.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onye bụ nnukwu onye ọbịa pụrụ ichè na mmemme ahụ ma bụrụkwa aka na-achiị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nkwàlite egwuregwu na steeti ahụ, bụ Maazị Tony Olih mere ka a mara na asọmpi ahụ dabara adaba n'atụmatụ na n'ebumnobi ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nwere n'ihe gbasaara ịkwàlite egwuregwu na n'ịkwàlite ndị ntorobịa ka ha bụrụ ndị ga-abara onwe ha na obodo ha uru.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị iche iche egwuregwu bara na ndụ mmadụ nà ọtụtụ uru dị iche iche ọ na-ewèta n'obodo, ma kpọkuo ndị ntorobịa ka ha na-esonyesi ike n'egwuregwu, na-agbasikwa mbọ ike ịchọpụta ọnatrachi dị iche iche Chineke jiri gọzie ha, iji tinye ya n'ọrụ, ma were ya bàárá onwe ha úrù.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ndị ntotobịa na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Theresa Obiekezie kèlèrè ọchịchị Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo ya nye egwuregwu na ndị ntorobịa na steeti ahụ, ma kọwaa na ụdị ọmarịcha asọmpi dị etu ahụ ga-akpọpụ uchè ndị ntorobịa n'ime ihe ọjọọ, ma mepekwara ha ọmarịcha ụzọ na ohere ọma dị iche iche ha ga-esi bara onwe ha uru.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Dọkịta Timothy Ifediọramma, nà ògbò ya nke na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Awka South', bụ Dọkịta Nnamdị Okafor tòrò nwa amadi ahụ kwadoro asọmpi egwuregwu ahụ, ma kelee ya maka ọmarịcha atụmatụ dị etu ahụ, ọbụladị dịka ha gbara akaebe na nke ahụ ga-enyere gọọmentị aka n'ịchọpụta ndị ntorobịa nwere ọmarịcha ọnatarachi dị iche iche n'ihe gbasaara egwuregwu ma nyekwa ha nkwàdo n'ụzọ kwesiri ekwesi, iji site na ya bàárá onwe ha uru, bụrụkwa ndị kwụụrụ onwe ha.

Na mbụ n'okwu nke ya, onye nkwàdo ihe mmemme ahụ, bụ Maazị Ọgụejiọfọr (nke ọ bụ Maazị Chijioke Nwakor nọchiri anya ya) mèrè ka a mara na asọmpi ahụ bụ àgbà nke mbụ ya, ma kọwakwa na ebumnobi ya bụ iji mee ka ndị ntorobịa ahụ tinye uche n'ihe ga-abara ha uru ma ghara ịbụ ndị ga na-etinye anya n'ihe ọjọọ maọbụ na-eme ihe adịghị mma n'obodo. O kwezịrị nkwà ịga n'ihu na-akwàdo asọmpi ahụ, ma kwupụtakwa ezi olileanya o nwere ime ya ka ọ bụrụ asọmpi a ga na-eme n'ogoogo steeti, nke ndị ntorobịa sitere obodo na okpuru ọchịchị dị iche iche n'Anambra ga-esonyezị na ya n'ọdịnihu.

Ọ bụ naanị otu ọ̀kpụ̀ ha sụnyere n'àgbà nke abụọ n'asọmpi ahụ ka ndị Ndị Nimo jiri wee merie ndị ògbò ha ndị Abagana, wee maburu ya bụ iko na ọkpụrụ ego so ya, ma gwakwazie ndị ògbò ha chebiri mgbe ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484