Anyachebelu Agbapeela Ụlọikpe Majie Dị n'Ụkpọr

Dec 16, 2020 - 16:56
Jan 30, 2021 - 16:57
 0
Anyachebelu Agbapeela Ụlọikpe Majie Dị n'Ụkpọr

Izunna Okafor

Ọkaikpe Nkwụmọtọ na steeti Anambra, bụ Ọkaikpe Onochie Manasseh Anyachebelu nọrọ na nsonso a wee gbapegharịa ụlọikpe majie dị n'Ụkpọr, bụ 'Ukpor Magistrates' Court, n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' na steeti Anambra, bụ nke e dozigharịrị edozigharị ma mee ka ọ dịkwa ọhụụ.

Ya bụ ụlọikpe bụ nke e dozigharịrị site n'aka gọọmenti ọchịchị obodo Ụkpọr, bụ 'Ukpor Improvement Union' (U.I.U.) ma bụrụkwa nke nwezịrị oche ọhụrụ ugbua, nwee ọtụtụ ohèrè maka ndị ịdọba ụgbọala, nwee ebe a na-aga mposi, nwee igwè na-enye ọkụ, tínyéré ya bụ ụlọ n'onwe ya, bụ nke e siri n'isi dozigide wee ruo n'ala ma tekwa ya uhie mara mma nke ukwuu, tinyéré ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka e tinyere n'ebe ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Emmanuel Nwachukwu mere ka a mara na ala ebe ahụ ụlọikpe ahụ dị bụ onyinye afọ ofùfò nke Ụmụnna Dara Okpara (ndị jibụrụ ebe ahụ mere ama ezumeezu ya) nyere ndị ogbè Umuhu, bụ ndị nyekwara ya ndị Ukpor dịka onyinye afọ ofufo; ha bụ ndị Ukpor wee nyezie ya gọọmenti steeti Anambra, e wee rụzie ya bụ ụlọikpe n'ebe ahụ

Dịka o siri kọwaa, inye ya bụ onyinye si n'aka fere aka bụ nke ebumnobi ya bụ iji hụ na e nwere  Ụlọikpe n'Ukpor, iji bèlatara ụmụafọ obodo ahụ nakwa ndị obodo ọzọ gbara ha gburugburu ihe isiike ha na-agabiga n'ịchọrọ ikpe nkwụmọtọ gaba ebe tere aka.

Dịka ọ na-ekele ndị tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ọrụ idozigharị ụlọikpe ahụ gara nke ọma, Maazị Nwachukwu fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye Ọkaikpe Anyachebelụ maka ịza ọkpụkpọ oku ha wee bịa sonye na mmemme ahụ.


O gosipụtara olileanya o nwere na site n'ezi ọnọdụ ụlọikpe ahụ nọzị na ya ugbua, na a ga-ebulizị ya ka ọ nọrọ n'ogoogo ịbụ 'Ukpor Magisterial District', bụkwa nke ọ rịọrọ Ọkaikpe Anyachebelụ ka o meere ha dịka o siri kwesi ekwesi, n'ihi na o teelarị ha ji atụ anya ihe dị etu ahụ.

Na nzaghachi, Ọkaikpe Anyachebelu mèrè ka a mara na ihe a rụrụ ma n'ime ụlọikpe ahụ ma na mpụta ya tụrụ ya anya maka na ebe niile ahụ bụzị sọ mma. O kelèrè ndị Ukpọr maka ọmarịcha ọrụ ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkùrù ndị obodo ndị ọzọ ka ha nyere gọọmenti aka n'ọrụ site n'idozigharị maọbụ imezigharị ụfọdụ ihe adịchaghị ka ha siri kwesi n'obodo ha dị iche iche, n'ihi na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja

O kwere nkwa na ya ga-azọpụ ụkwụ banyere arịrịọ ahụ ndị Ụkpọr rịọrọ ya maka ibuli ụlọikpe ahụ n'ogoogo ịbụ 'Ukpor Magisterial District', mana o chètàkwààrà ha na e nwere usoro dị iche iche a na-agbaso ma nwekwa ihe dị iche iche a na-eme tupuu e nweta ya. O kwere nkwà na ngwangwa ha gbasòrò ya bụ usoro ma mezuo ihe ndị ahụ, ihe ahụ ha na-achọ ga-eru ha aka ozigbo, dịka o siri kwesi ekwesi.

N'okwu nke ya na mmemme ahụ, onyeisioche òtù 'Nigerian Bar Association' (NBA) ngalaba nke Nnewi, bụ Maazị Kingsley Awuka Esq., gosipụtara obi añụrị ya banyere ọnọdụ ụlọikpe ahụ ugbua, ma kwuo na a ga na-ekpezị ikpe ebe ahụ kwá ụbọchị ọrụ ọbụla, karịa ịdị na-emezị ya na mbugharị na mbugharị maọbụ a gụrụ gụrụ. O kwuru na ya bụ ụlọikpe ga-enyekwa aka kwalite ọrụ ikpe na mpaghara ahụ na steeti ahụ n'ìzùgbe ma mekwazie ka a na-ekpe ikpe ngwangwa.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' bụ Maazị Chieloka Henry Okoye kọwàrà ụlọikpe dịka ihe dị mkpa n'obodo ọbụla n'ihi uru dị iche iche ọ bara n'inye ndị mmadụ ikpe nkwụmọtọ na n'ibèlata mpụ na arụrụala n'obodo.

Dịka ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha na-aga n'ụkọikpe oge ọbụla ha nwere nsogbu dị añaa, karịa iji aka ha na-eme ihe iwu akwadòghị, Maazị Okoye kwuru na ọchịchị ya ga-azọpụ ụkwụ ma gbasie mbọ ike ịhụ na e nwere ya bụ 'Magisterial District' na mpaghara okpuru ọchịchị ahụ.

N'akụkụ nke ya, otu onye sitere obodo ahụ, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi South' nke abụọ n'ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Johnbosco Akaegbobi kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbua n'obodo ahụ, nke Maazị Emma Nwachukwu mepụtagoro, ma kelee ha maka ezi ọrụ ahụ, ọkachasị nke a ha rụrụ na nsonso a iji mee ka ya bụ ụlọikpe chawapụ.

O kwere nkwà na ya onwe ya ga-entinye aka ma tinyekwa ijè ụkwụ, iji nweta ihe ahụ ha na-arịọ ka e nye ha, bụ 'Ukpor Managerial District', bụkwa nke o mere ka a mara na ya na Ọkaikpe Anyachebelụ akpaala banyere ya n'oge gara aga.

Ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè eze ọdịnala Ukpor, bụ Igwe Igwe Felix Chinedu Onyimmadu; onye Majie na-elekọta ụlọikpe ahụ, bụ Ọkaiwu E.C. Okwudili Esq.; onye a họpụtara ọhụụ ịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ignatius Nwawulu; ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'obodo ahụ, nke gụnyere Dim Nna O. Nnakife; Maazị Mortimer Muojekwu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.