Anambra 2021: Dọkịta Maduka Ahapụla PDP, Bàá Accord, Kwuo Ihe Ọ Ga-Emere Anambra

Aug 12, 2021 - 22:16
 0
Anambra 2021: Dọkịta Maduka Ahapụla PDP, Bàá Accord, Kwuo Ihe Ọ Ga-Emere Anambra

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.


Nwa amadi ahụ chọbụrụ iji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'People's Democratic Party (PDP)' wee zọọ ọkwa Gọvanọ steeti Anambra, bụ Ọkammụta Dọkịta Godwin Maduka abaala otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Accord' ma bụrụkwazie onye ga-eji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ wee zọọ ya bụ ọkwa gọvanọ na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

Dọkịta Madụka kwupụtara nke n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ kwuwaa hoohaa na ọ bụ ya jizị ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ Accord were esonye n'ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ.

O mere ka a mara na ihe o jiri hapụ otu ndọrọndọrọ PDP bụ n'ihi na obi adịghị ya mma banyere etu ndị òtù ha siri wee chịkọba nhọpụta imeụlọ ha maka onye ga-eji aha otu ahụ wee zọọ ọkwa, ma kọwaa na wuruwuru na igwù ojoro jupụtara na nhọpụta ahụ e mere.

Dịka ọ na-akọwa na 'Accord' bụ ezigbo otu ndọrọndọrọ ọchịchị ma nke ekwe na-akụ n'ala Nigeria ma na-emekwa nke ọma n'ime obodo, Dọkịta Maduka gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ Chiifu Kenneth Obi bụ osote  ya n'ịzọ ọkwa ahụ.

Oge ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụọnụ, ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe dị iche iche ọ ga-eme dịka gọvanọ ma ọ bụrụ na o nwete mmeri n'ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ, ọbụladị dịka o kwuru na ihe mere o jiri si mba Amerika bàta maka isonye n'ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ bụ ka o wee gaara Anambra bụ steeti ya ozi.

Banyere ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na o mechaa turu ùgò dịka Gọvanọ steeti ahụ, Dọkịta Maduka kwuru na ebumnobi o ji azọ ọkwa gọvanọ bụ ka o jeere steeti ya na Ndị Anambra ozi, n'ihi na o meela ọtụtụ ihe na-ewu ewu na ihe dara ụda na mba ụwa, nweta nzere na agụmakwụkwọ dị iche iche, ma nwekwa ezi ọgụgụisi, amamihe na ahụmahụ dịka ezi onye ndu, bụzị nke mere ya ka ọ bụrụ onye kacha tozuo òkè n'ime ndị niile ahụ so ya azọ ọkwa gọvanọ ahụ.

O kwuru na o nweta nturuugo, na ọ ga-ebu ụzọ kwalite ezi ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, kwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ site n'ime ka nri dị gbàànyụụ, kwàdo ma nye ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị ọrụ ka ha wee bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, nwògharị ngalaba ahụike, nglaba mmụta na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ.

Ya bụ nwa amadi nwe ụlọọrụ 'Las Vegas Pain Institute and Medical Cente' dị na mba USA gàrà n'ihu kwe nkwà na ọ ga-ekpochasị gburgburu Ohimiri Naịja dị n'Onitsha ma gbuwaa ya wee ruo ogbu mmiri Atlantic Ocean, iji mee ka e si ebe ahụ na-ebubata ngwaahịa site na mba ofesi, kwàlite ọnọdụ mmepe na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o kwere nkwà ọ ga-eme, ọbụladị dịka o gosipụtara olileanya o nwere na ọ ga-enweta mmeri na nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme, ma kpọkuzie ndị Anambra ka ha kwàdo ya.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisioche otu ndọrọndọrọ Accord na steeti Anambra, bụ Maazị Bartholomew Igwedibia gbara akaebe na ọ bụ Dọkịta Madụka ga-ejizị aha otu ndọrọndọrọ ahụ wee zọọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, ma kọwaa ya bụ nwoke dịka onye tozuru òkè, gụọ akwụkwọ nke ọma, ma nwekwa ihe niile a chọrọ iji chịa ma dozie steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, onye ahụ ga-eso Dọkịta Madụka wee zọọ ọkwa gọvanọ ahụ dịka osote ya, bụ Chiifu  osote Kenneth Obi mere ka a mara na ọ bụ Accord bụ aha otu ndọrọndọrọ mbụ na-adị na-akwụkwọ e ji atụ akwụkwọ, ma gosipụtazie olileanya o nwere na otu ndọrọndọrọ ahụ ga-eturu ugo ma gbakwa ndị nke mbụ na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme.

Ọ dị ncheta na ọ bụ Maazị Alex bụbụ onye ji ọkọlọtọ ọtu ndọrọndọrọ Accord, ma ọ rịtuzịịrị Dọkịta Madụka ka o jiri aha òtù ahụ wee zọọ ọkwa ahụ, maka na ọ na-adị mma a hụ ihe ka ubi, e ree ọba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484