Agụmakwụkwọ: Sinetọ Umeh Ekesàrála Ụmụakwụkwọ Nde Naịra Iri

Jul 1, 2021 - 14:29
Jul 1, 2021 - 21:44
 0
Agụmakwụkwọ: Sinetọ Umeh Ekesàrála Ụmụakwụkwọ Nde Naịra Iri

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala nkwàdó agụmakwụkwọ dịka otu n'ime nkwàdo kachasị nkwàdó mmadụ pụrụ inye mmadụ ibe ya, ọkachasị onye ntorobịa maọbụ nwatakịrị, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na nke ahụ.

Onye ahụ nọchitere anya ọgbọ nta nkwado Anambra etiti n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Sinetọ Victor Umeh bụ ya kwupụtara nke a na mmemme ọ chịkọbara iji kesàára ndị nọ n'okpuru nkwàdo agụmakwụkwọ n'efu ọ na-enye ego nkwàdo.

Mmemme nkesà ego nkwàdó agụmakwụkwọ ahụ a maara dịka 'Victor Umeh Education Foundation (VUMEF) bụ nke weere ọnọdụ na be nwa amadi ahụ, ma bụrụkwa nke o sitere na ya kesàára ha ego ruru nde naịra iri.

Ya bụ mmemme bụ nke ọ na-eme kwà ahọ ọbụla kemgbe ahọ iri na anọ gara aga, ma bụrụkwa nke o sitere na ya wee nye ụmụakwụkwọ mahadum karịrị iri iteghete n'ọnụọgụgụ ego ruru otu narị puku naịra n'otu n'otu maka ịkwàdò agụmakwụkwọ nke ahọ 2020/2021.

N'okwu ya oge ọ na-enye ndị ahụ ego nkwàdo ahụ, Sinetọ Umeh kwupụtara obi ụtọ ya banyere mkpụrụ dị iche iche atụmatụ nkwàdo agụmakwụkwọ ahụ mịpụtagoro nà ndị dị iche iche e sigoro na ya zụpụta kemgbe e jiri malite ya, ma kelee Chineke maka ịkwàdò ya bụ atụmatụ.

Ọ gbara akaebe na ohere agụmakwụkwọ ahụ azụpụtala ọtụtụ ndị na-eme nke ọma na ngalaba dị iche iche ugbua, ma kwe nkwa ịga n'ihi na-akwàdo ya bụ atụmatụ; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụakwụkwọ ahụ na-erite uru na ya bụ atụmatụ ka ha dị uchu n'agụmakụkwọ ha ma na-emewanye nke ọma, n'ihi na ọ na-abụrụ ha ihe agbamume oge ọbụla ọ hụrụ ha ka ha na-eme nke ọma n'agụmakwụkwọ ha maọbụ n'ihe ha na-eme oge ha gụchara akwụkwọ.

Na mbụ n'okwuchukwu ya na n'ịka ụka e jiri malite mmemme ahụ, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ekwulọbịa, bụ Bishọọpụ Peter Okparaeke kọwara Sinetọ Umeh dịka nwoke obiọma Chineke ji akwara ngwaọrụ n'ụzọ dị iche iche n'ịgbanwe ọnọdụ obibindụ na ọnọdụ akụnụba ụmụ mmadụ ụwa na-atụ n'ọnụ.

Ọ kpọkuru ndị dị iche iche ọnọdụ dịịrị mma ka ha ñomie Sinetọ Umeh site n'icheta ndị ụwa na-atụ n'ọnụ bigasị na gburugburu ha, ma kpekwazie ekpere ka Chineke gọzie Sinetọ Umeh ma kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji maka ezi ọrụ dị iche iche ọ rụgoro na ndụ ụmụ mmadụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, otu onye n'ime ọtụtụ ndị ritere uru n'atụmatụ agụmakwụkwọ ahụ, bụ Dọkịta Juliana Umeh nọkwara n'ebe ahụ wee kwupụta ma kelee Chineke na Sinetọ Umeh maka nzèré 'Distinction' n'ule 'Internal Medicine and Surgery' nke ngalaba agụmakwụkwọ ahụike na Mahadum Port Harcourt, bụkwa nke mere ya onye mbụ nwetagoro nzere ahụ na ya bụ mahadum.

Nwaada Umeh, bụ nwaafọ Etti, Nanka, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Orumba North' nke steeti ahụ kọrọ akụkọ ụwa ya etu ọ kaara isi chịkọta ma kwụsị agụmakwụkwọ ya oge nna ya nwụrụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017, tupu Sinetọ Umeh wee gbataziere ya ọsọ enyemaka wee zụgide ya n'agụmakwụkwọ wee ruo ugbua ọ gụchara akwụkwọ ma nwetekwa nzere dịka onye kachara mee nke ọma na ngalaba ọmụmụihe ahụike na mahadum ahụ.

O nyekwàzịrị ndị ahụ na-agụ akwụkwọ e kesààrà ego nkwàdo ahụ ụbọchị ahụ ndọmọdụ ka ha gbado anya nke ọma n'agụmakwụkwọ ha ma gbalịsikwa ike mee nke ọma, ka ha wee jiri nzere kacha mma wee pụta.

Ọtụtụ ndị ọzọ ritekwara uru n'atụmatụ nkwado ahụ kelekwazịrị Sinetọ Umeh, kwe nkwa ịdịwanye uchu n'agụmakwụkwọ ha, ma kpekwaziere Chineke ka ọ gaa n'ihu ịgọzi na ibuli Sinetọ Umeh elu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484