ACTDA Arụọla Ọmarịcha Ụlọ Mposi Ọgbaraọhụrụ n'Awka

Jun 30, 2021 - 20:52
Jun 30, 2021 - 21:01
 0
ACTDA Arụọla Ọmarịcha Ụlọ Mposi Ọgbaraọhụrụ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a


A dụọla ụmụ amaala ọdụ ka ha na-echekwa ihe dị iche iche gọọmentị rụrụ na mpaghara ha, iji zeere imebi ya, ya na ime ka ọ dịgidere ha.

Onyeisi ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA), bụ Venerebụụl Dọkịnta Amaechi Okwuosa bụ ya kpọrọ oku a n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere ọmarịcha ụlọ mposi ọgbaraọhụrụ a rụrụ na mpaghara 'Unizik Temp. Site Junction' dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụ nke a rụrụ site n’aka ụlọ ọrụ ya bụ ACTDA.

Dịka o si kwuo, ebumnobi e jiri wuo ụlọ mposi ahụ bụ iji belata arụrụnsị na ịga mposi ebe ekwesighị ekwesi, bụ nke a na-ahụkarị ndị mmadụ ka ha na-eme na gburugburu ebe ahụ n'agbanyeghị ọkwa dị iche iche ụlọọrụ ahụ na-ama kemgbe ahọ 2018 na etu ha si adọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kwụsị ịga mposi n'ebe ekwesighị kwesi, bụkwazị nke amịtàghị mkpụrụ a tụrụ anya.

Dịka ọ na-akọwapụta na ọ bụ otu n'ime ọrụ dịịrị ụlọọrụ ya ịkwalite mmepe Awka bụ isi obodo steeti ahụ na obodo ndị ọzọ dị iche iche ụlọọrụ ya na-elekọta; onyeisi ụlọọrụ ACTDA ahụ mèrè ka a mara na ụlọ mposi ahụ bụ nke dị na mba England ka a gbasoro ụdịdị ya wee rụọ ya, ọbụladị dịka o kwupụtara ezi olileanya o nwere na ya bụ ụlọ mposi ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ibelata ịrụ arụrụnsị na mpaghara ahụ, bụ ịga mposi n'ebe ekwesighị ekwesi, ma ihe égwù na ihe izendụ dị iche iche dị na ya.

Na nkọwa ya banyere ụlọ mposi ahụ, o kwuru na o nwegbàdoro ihe niile zuru òkè ụlọ mposi ọgbaraọhụrụ na-enwe, ma kọwakwazie na o nwere ngalaba dị iche maka ụmụnwoke, nke nwere ebe a na-aga mposi na ebe a na-anyụ mamịrị. O kwukwara na ya bụ ụlọ mposi nwekwàrà ngalaba dị iche maka ụmụnwaanyị, bụkwa nke yiri nke ụmụnwoke, dịka o siri metụta akụrụngwa e tinyere na ha.

Dọkịta Dọkịnta Okwuosa gàkwàrà n'ihu kọwaa na ya bụ ụlọ mposi nwèrè ngalaba pụrụ iche maka ndị ikedịnobi (ndị ọlụsị) bụkwa ndị ọtụtụ ndị na-ewu ụlọ ọhaneze n'ala Nigeria anaghị ebu n'obi maọbụ lebara anya mgbe ha na-arụ ụlọ. N'ịgbakwụnye na nke ahụ, o kwukwàrà na ya bụ ụlọ mposi nwere ebe pụrụ iche maka ụmụnwaanyị dị ime. Ọ sị na ha gbapukwara mmiri n'ogige ụlọ mposi ahụ ma tinyesikwa ọkụ ebe ahụ nke ọma iji hụ na ọ na-arụ ọrụ etu o kwesiri ma na-adịkwa ọcha oge niile.

Dịka ọ na-ekwu na ụlọ mposi ahụ ga na-arụgodi ọrụ n'agbátà elekere asaa nke ụtụtụ wee ruo elekere asaa nke anyasị, Maazị Okwuosa mere ka a mara na ogige ahụ ga-amalite na-arụ ọrụ ogologo ụbọchị niile n'ọdịnihu, ma kwuo na e tinyela ndị ọrụ nchekwa na ndị na-ehicha ụlọ n'ebe ahụ maka ichekwa ya na idebe ya ọcha oge niile.

O kwukwara na ogige ụlọ mposi ahụ nwèrè naanị otu ọnụ ụzọ e si abata na ya, ma sịkwa na e jiri ogige eriri ígwè wee gbachie gburugburu ogige ahụ, iji wee na-elekọta etu ndị mmadụ si abata ma na-apụ n'ebe ahụ, ya na iji gbochie ndị omekoome ịwakpò ndị ọrụ ha maọbụ ndị na-aga mposi n'ebe ahụ. 

N'otu aka ahụ, o jikwàzịrị ohere ahụ wee dọọ ndị omekoome aka na ntị ka ha gharakwa ịnwà ànwà chee echiche iji ogige ụlọ mposi ahụ maọbụ gburugburu ya dịka ọnọdụ maọbụ ebe nzuzo maka iji rụọ arụrụala maọbụ mee ihe ọbụla iwu akwadòghị, maka na ụlọọrụ ya agaghị anabata nke ahụ chaa chaa.

Ven. Okwuosa mere ka a mara na ụlọ mposi ọgbaraọhụrụ ahụ bụ nke ha rụrụ n'aha nwunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, iji kwanyere ya ùgwù ma kelee ya maka ọmarịcha ọrụ obiebere dị iche iche ọ rụgoro na steeti ahụ. Ọ sị na ya bụ nwunye gọvanọ arụọla ụlọ mposi n'okpuru ọchịchị ime obodo iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ọrụ ebere ndị ọzọ ọ rụgoro, nke mezịrị ya ka ọ pụọ iche n'etiti ndị ọzọ bụgoro nwunye gọvanọ na steeti ahụ.

Ka ọ na-ekelekwa aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka nkwàdo ọ na-enye ụlọọrụ ahụ kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, Okwuosa mekwara ka o doo anya na ụlọ mposi ahụ bụ ụdị nke mbụ  ya, ma kwekwazie nkwa na a ga-arụkwa ya na mpaghara ndị ọzọ dị mkpa n'ebe dị iche iche nọ n'okpuru nlekọta ụlọọrụ ACTDA; ọbụladị dịka ọ gwara Ndi Anambra ka ha gbaa mbọ hụ na ha chekwabara ụlọọrụ gọọmentị na ihe dị iche iche gọọmenti rụrụ na mpaghara ha, maka na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awachi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484