A Kpọkuola Ndị Igbo Ka Ha Na-Akwalite Asụsụ Ha

Nov 19, 2020 - 15:55
Jan 30, 2021 - 15:56
 0
A Kpọkuola Ndị Igbo Ka Ha Na-Akwalite Asụsụ Ha

Izunna Okafor

A kpọkuola ndị Igbo ka ha na-akwàdo ma na-akwàlite asụsụ ha, ka o wee ghàra ifùnahị ya, maọbụ nwụọ, dịka ndị otu UNESCO buru n'amụma.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi òtù Sụwakwa Igbo, bụ Ọkammụta Pita Ejiọfọ, n'okwu ya na mmemme otu ụbọchị a chịkọbara site n'aka ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Awka, maka ịkwalite asụsụ na omenala Igbo.

Ọ kọrọ akụkọ banyere etu o siri bagide na njem mgbasa oziọma maka ịkwado asụsụ Igbo n'ahọ 2002, ma kwaa arịrị banyere etu ndị Igbo sizị agbakụta asụsụ ha azụ ma na-asụzị asụsụ bekee na asụsụ ndị ọzọ.


O kwuru na ọ bụ ihe dị etu ahụ na-eme asụsụ Igbo ji adà n'ụra ọnwụ. O mere ka a mara na ọrụ ịkwàlite asụsụ Igbo bụ ọrụ dịịrị onye Igbo ọbụla, ma kelekwa ọbaakwụkwọ steeti Anambra maka ịchịkọba ụdị ọmarịcha mmemme ahụ. O kwekwazịrị nkwà na ya na òtù ya bụ Otu Sụwakwa Igbo agaghị ada mbà n'ịtụnye ụtụ nke ha n'ịkwalite asụsụ na omenala Igbo.

N'ozi nnọọ ya, onyeisi ọba akwụkwọ Steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kwuru na ha tụpụtàrà atụmatụ ịchịkọba mmemme ahụ, dịka otu ụzọ nke ha bụ ndị ọba akwụkwọ ọhaneze si atụnye ụtụ nke ha ma na-enyekwa aka n'ịkwàlite asụsụ na omenala. O kwuzịrị na ha ga na-emezị mmemme ahụ kwà ahọ ọbụla.


Dọkịta Udeze kwàra arịrị etu ndị nkụzi n'ụlọakwụkwọ dị iche iche, na ndị nne na nna bụ ndị Igbo esighị asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo, ma na-egbochikwa ndị mmadụ ịsụrụ ha ya bụ asụsụ Igbo ma n'ụlọakwụkwọ ma n'ezinụlọ ha dị iche iche.

Ọ kpọpụtasịrị uru dị iche iche dị na mmadụ ịma asụ asụsụ ya, ma kpọkuo ndị ọnụ na-eru n'okwu ka ha gbaa mbọ ileta ka ndị mmadụ si erube isi nye ntụziaka ahụ gọọmenti steeti ahụ nyere ka a na-asụ asụsụ Igbo ma na-ejikwa ejiji Igbo n'ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ gọọmenti dị iche dị iche iche na steeti ahụ kwà ụbọchị Wenezdee ọbụla na steeti ahụ.

N'okwu nke ya, Eze ọdịnala obodo Nibo, bụ Igwe Michael Chukwuemeka Ngene (Ezeike Nibo nke anọ) kpọkùrù ndị Igbo ji ọkwa ọchịchị maọbụ nọrọ n'isi na mpaghara ebe dị iche iche ka ha na-asụrụ ndị nọ n'okpuru ha bụ ndị Igbo asụsụ asụsụ Igbo oge niile iji chekwaba ya ka ọ ghara ịnwụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche Ọhaneze Ndị Igbo, bụ Maazị Damian Okeke-Ogene gbarụrụ ihu banyere etu asụsụ na ihe dị iche iche e jiri mara ndị Igbo si anwụzị anwụ ugbua ma na-efùkwa n'ike n'ike, n'ihi etu ndị Igbo si agbahapụ ha ma na-eñòmiri asụsụ na njirimara ndị mba ọzọ. Ọ kpọrọ òkù ka e welitekwuo aka n'ụgwọ a na-akwụ ndị na-akụzi asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ dị iche iche nq steeti ahụ, ma na-enyekwa ha ọzụzụ na mgbe na mgbe.

Ndị ọzọ dị iche iche kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè Ọkammụta Nkechi Nwokoye nke Mahadum Nnamdi Azikiwe University dị n'Awka, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ sekọndịrị, bụ Dọkịta Paul Ifeanyị; odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na minịstịrị na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ, bụ Oriakụ Oby Umeadi; onye ntorobịa na-ede akwụkwọ, bụ Maazị Michael David Ogbonnaya, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

A nọkwara na mmemme ahụ mee ihe ngosi dị iche iche, mee asọmpi nsụpè, edemede na agụmagụ asụsụ Igbo, gbaa egwu ogene, maa mbem, tinyere ihe ndị ọzọ dị iche iche mere ka mmemme ahụ dàà ụdà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.