A gbaana ndị otu Donald Trump abụọ akwụkwọ

A gbaana ndị otu Donald Trump abụọ akwụkwọ

Oct 30, 2017 - 18:44
Jan 19, 2021 - 18:44
 0
A gbaana ndị otu Donald Trump abụọ akwụkwọ

Ọkaịkpa pụrụ ịche ahụ a họpụtara na mba Amerịka ka o mee nnyocha maka ebubo ahụ a na-ebo onye isi ala Amerịka, bụ Donald Trump, agbaana ndị otu Trump abụọ, Paul Menafort na Rick Gates akwụkwọ n’ụlọ ịkpe.

Kemgbe e mechara ntụli aka maka ịhọpụta onye isi ala na mba ahụ, a na-ebo Trump na ndị otu ya ebubo na ha na ndị Rọshịa gbakọrọ aka mee nrụrụ aka, ma ọ bụ gwuo ojoro, nke mere Trump jiri nwete mmeri megide Hillary Clinton n’afọ gara aga.

Ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka nyocha n’Amerịka, bụ Federal Bureau of Investigation (FBI), malitere tinyewe anya n’ebubo ahụ. Trump tụgharịrị chụọ onye isi ndị FBI, bụ James Comey, n’ọrụ. Nke a mere e jiri họpụta Robert Mueller dịka onye okaịkpe pụrụ ịche maka ịme nnyocha.

Mueller na ndị otu ya na-eme nnyocha kemgbe ọnwa ise gara aga.

Taa bụ Mọndee, abalị 30 nke ọnwa Ọkụtoba, Robert Mueller gbara Menafort na Gates akwụkwọ.

Anyị amatachabeghị ihe niile Mueller si mmadụ abụọ ndị ahụ mere. Kama, anyị na-atụ anya n’akwụkwọ ahụ a gbara ndị a taa ga-agụnye akparama agwa aka azụ, yana izo usoro nzụkọrịta okwe n’etiti Menafort na ndị mba Yukren.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.